O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala: O we nara ob͕e achicha asa ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ka ha debe n'iru ha; ha we debe ha n'iru ìgwè madu ahu.
Ma Ọ siri ha, Unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si, Ayi enweghi kari ob͕e achicha ise na azù abua; ma-ọbughi na ayi onwe-ayi gāga zuta nri nye ndi nka nile.