Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 8:33 - Bible Nso

33 Ma mb͕e O chighariri, hu ndi neso uzọ-Ya, Ọ bara Pita nba si, Ga n'azum, Setan: n'ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n'ihe Chineke, kama ọ bu n'ihe madu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Ma ọ tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya, baara Pita mba sị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ ekwensu! Ihe ị na-eche echiche ya abụghị uche Chineke, ha bụ echiche mmadụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 8:33
24 Iomraidhean Croise  

Devid we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ, umu-ndikom Zeruaia, na unu gāburum onye-nmegide ta? àgēme ka nwoke ọ bula nwua n'Israel ta? n'ihi na ọ̀ bu na amaghm na ta ka mu onwem bu eze Israel?


Ọ si ya, Dika otù nime ndinyom nzuzu si ekwu, otú a ka i nēkwu. Àyi gānara kwa ezi ihe n'aka Chineke, ghara inara ihe ọjọ? Nihe a nile Job ejighi eb͕ub͕ere-onu-ya mehie.


Ka onye ezi omume tib͕uem, ọ gābu ebere; Ya ba-kwa-ram nba, ọ gābu manu isi; Ekwela ka isim si, É-è: N'ihi na m'nọ nēkpe ekperem imegide ihe ọjọ ha nile.


Akpọla nwa-nne-gi asi n'obi-gi: i ghaghi ibara madu-ibe-gi nba, ghara ibu nmehie bayere ya.


Ma Ọ zaghi ya okwu ọ bula. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, nēkpere Ya, si, Zilaga ya; n'ihi na ọ nētiso ayi nkpu.


Ma O chighariri, si Pita, Ga n'azum, Setan: i bu ihe nēme ka M'ma n'ọnyà: n'ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n'ihe Chineke, kama ọ bu n'ihe madu.


Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.


Mb͕e O lesiri ha anya buruburu, bú ndi nọ Ya buruburu, Ọ si, Le, nnem na umu-nnem!


Mb͕e O lesiri ha anya gburugburu n'iwe, ebe ọ nēwuta Ya nke-uku, bú na anēme ka obi-ha ma etili, O we si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di mbu.


Onye-nwe-ayi we chigharia, le Pita anya. Pita we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ta, i gāgọnarim ub͕ò atọ.


Jisus we za, si ya, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.


O we chigharia, bara ha nba, si, Unu amataghi aha mọ di nime unu.


irara onye di otú a nye n'aka Setan ibibi anu-aru-ya, ka ewe zọputa mọ-ya n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus.


ndi ọgwugwu-ha bu ila-n'iyì, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n'ihere-ha, ndi nātukwasi uche n'ihe uwa.


Nātu ndi nēmehie nmehie-ha n'anya n'iru madu nile, ka ndi fọduru we tu kwa egwu.


Àmà nka bu ezi-okwu. N'ihi ihe a were kwa aka ike tu ha nmehie-ha n'anya, ka ha we nwe ezi ndu nime okwukwe-ayi,


Ya mere, ebe Kraist huru ahuhu n'anu-aru, unu onwe-unu were kwa otù izù ahu ke dika ekike-agha; n'ihi na onye huworo ahuhu n'anu-aru agharawo nmehie;


Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n'uwa, n'anya. Ọ buru na onye ọ bula ahú uwa n'anya, ihu-n'anya nke Nna-ayi adighi nime ya.


Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n'anya, anamatu ha nmehie ha n'anya, zí kwa ha ihe site n'inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n'obi, chèghari kwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan