Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 7:4 - Bible Nso

4 ọzọ, mb͕e ha si n'ahia lata, ọ buru na ha efesaghi onwe-ha miri, ha adighi-eri ihe: ọtutu ihe ọzọ di kwa, nke ha natara ijide, dika ime iko, na ite, na ihe ọla, baptism.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Mgbe ọbụla ha si nʼahịa lọta, ha adịghị eri nri ma ọ bụghị ma ha sachara onwe ha. Ha na-edebekwa ọtụtụ omenaala ndị ọzọ dị ka ịsacha iko, na ite mmiri na ketụlụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 7:4
15 Iomraidhean Croise  

Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ; We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:


Sanu aru, menu onwe-unu ka unu di ọcha; wezuganu ihe ọjọ nke omume-unu nile n'iru anyam abua; rapunu ime ihe ọjọ:


M'we che n'iru umu ulo ndi Rikab ọkwa ufọdu juputara na manya-vine na iko ufọdu, m'we si ha, Ṅuanu manya-vine.


Sapu obi-gi n'ihe ọjọ, gi Jerusalem, ka ewe zọputa gi. Rùe ole mb͕e ka i gēme ka ajọ èchìchè-gi nile nọ ọnọdu-abali n'etiti gi?


Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēme ka azu iko na afere di ọcha, ma n'ime ha juputara site n'ipunara madu ihe na ejideghi-onwe-unu.


Gi Farisi kpuru ìsì, buru uzọ me ka ime iko na afere di ọcha, ka azu-ha we ghọ kwa ọcha.


Ma mb͕e Pailat huru na okwu-ya abaghi n'ihe ọ bula, kama na ùzù nāputa, o were miri, kwọ aka-ya abua n'iru ìgwè madu ahu, si, Ikpé ọbara Onye ezi omume a amaghm: unu onwe-unu le nke ahu.


Unu nārapu ihe Chineke nyere n'iwu, jide kwa ozizí madu nyere n'aka-unu idebe.


Ma adọbara n'ebe ahu ite nkume miri isi, dika ime-ọcha nke ndi-Ju si di, nānagide firkin abua ma-ọbu atọ n'otù.


Ya mere iju-ajuju putara n'etiti ndi nēso uzọ Jọn na onye-Ju banyere ime-ọcha.


ebe ha bu nání (ha na ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na ime-baptism di iche iche) ihe di iche iche nke anu-aru aguru n'ihe ziri ezi, enyere n'iwu rue oge imezi ihe.


Biarunu Chineke nso, Ọ gābiaru kwa unu nso. Menu ka aka-unu di ọcha, unu ndi-nmehie; me-kwa-nu ka obi-unu di ọcha, unu ndi nwere uche abua.


ma ọ buru na ayi ejegharia n'ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n'ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n'etiti onwe-ayi, ọbara Jisus, bú Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan