Ire bu kwa ọku, bú uwa ahu nke ajọ omume: ire nēguzo n'etiti ihe nile di ayi n'aru dika ihe nēnye aru dum ntupọ, nke nāfunwu kwa ihe nāga dika amuru ya ọku, ọku ala-mọ bu kwa ihe nāfunwu ire ahu ọku.
Òle ebe ibu-agha si bia, òle ebe kwa ilu-ọ̀gù si bia, bú nke di n'etiti unu? ọ̀ bughi n'ebe ahu, bú ihe-utọ nile unu nke nēbu agha n'ihe nile di unu n'aru, ka ha si bia?