Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 7:2 - Bible Nso

2 ndi hu-kwa-ra na ufọdu nime ndi nēso uzo-Ya nēri nri-ha n'aka ruru árú, nke ahu bu, aka anākwọghi akwọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 ha hụrụ na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ji aka na-adịghị ọcha, ya bụ aka a na-akwọghị akwọ, na-eri nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 7:2
12 Iomraidhean Croise  

N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ-Gi nējehie n'ozizí ndi-okenye nyere ayi n'aka idebe? n'ihi na ha adighi-akwọ aka mb͕e ọ bula ha nēri nri.


Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ we jua Ya, si, N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ-Gi nējeghi ije dika ozizí ndi-okenye nyere ayi n'aka idebe, ma ha nēri nri-ha n'aka ruru árú?


Ma mb͕e onye-Farisi ahu huru ihe Ọ nēme, o ju ya anya na O bughi uzọ kwo aka-Ya mb͕e Ọ gaje iri nri-ututu.


o we si ha, Unu onwe-unu mara otú ọ bu ihe nēzighi ezi n'iwu ka nwoke nke bu onye-Ju were onwe-ya rapara n'aru onye mba ọzọ ma-ọbu ijekuru ya; otú ọ di, mu onwem ka Chineke gosiri ka m'ghara ikpọ madu ọ bula ihe ruru árú ma-ọbu ihe nādighi ọcha:


Ma asirim, M'gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi: n'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula ihe ọ bula nke ruru arú ma-ọbu nke nādighi ọcha bàra n'ọnum.


Amataram, eme-kwa-ra ka m'kweye nime Onye-nwe-ayi Jisus, na ọ dighi ihe ruru árú site n'onwe-ya: ọ bu nání n'ebe ọ nọ, bú onye nāgu ihe ọ bula na ọ ruru árú, n'ebe onye ahu nọ ka ọ ruru árú.


ma àhuhu ahu jọkariri njọ ra aṅa, bú nke agāgu na onye ahu kwesiri ka enye ya, ka unu chère, bú onye nke zọworo Ọkpara Chineke ukwu, onye guwo-kwa-ra ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú nke eji do ya nsọ, n'ihe emeruru emeru, onye mewo-kwa-ra Mọ nke amara ihe-ihere?


ọ dighi kwa ihe ọ bula emeruru emeru, ma-ọbu onye nēme ihe-árú na ugha, gābà nime ya ma-ọli: kama ọ bu nání ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ nke ndu Nwa-aturu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan