Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 6:6 - Bible Nso

6 Ekweghi-ekwe-ha we ju Ya anya. Ọ nējeghari kwa obodo ntà nile ha buruburu nēzí ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Enweghị okwukwe ha juru ya anya. O jegharịkwara nʼobodo nta niile gburugburu na-ezi ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 6:6
12 Iomraidhean Croise  

O we hu na ọ dighi onye ọ bula di; ibobo we nwua Ya n'aru na ọ dighi onye nāriọrọ ayi aririọ: ogwe-aka-Ya we wetara Ya nzọputa; ezi omume-Ya kwa, nke ahu nākwagide Ya.


Ọ̀ di mba ab͕anweworo chi di iche iche ha, ọ bu ezie na ihe ahu abughi chi? ma ndim ab͕anwewo nsọpuru-ha n'ihe nadighi-abà urù.


Jisus we nējeghari na Galili dum, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche n'etiti ndi ahu.


Ma mb͕e Jisus nuru nka, o juru Ya anya, Ọ, we si ndi n'eso ya n'azu, N'ezie asim unu, Ọ dighi mb͕e M'huru oké okwukwe di otú a n'aru onye ọ bula n'Israel.


Jisus we nējeghari n'obodo na obodo ntà ha nile, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.


O we ba n'ulo-nzukọ nile ha gazue na Galili dum, nēkwusa ozi ọma nāchupu kwa ndi-mọ ọjọ.


O we si n'ebe ahu bilie, bia n'ókè-ala Judia, ya na ofè ọzọ nke Jọdan: ìgwè madu nile we zukọ ọzọ n'ebe Ọ nọ; ka O siri eme, O we nēzí ha ihe ọzọ.


O we nāga n'obodo na obodo ntà di iche iche, nēzí ihe, nāga kwa ije-Ya iru Jerusalem.


O we ridata na Kapanaum, otù obodo nke Galili, O we nēzi ha ihe n'ubọchi-izu-ike:


O nēkwusa kwa okwu Chineke n'ulo-nzukọ nile nke Galili.


Nwoke ahu zara, si ha, Ekwula, n'ihi na ihe-ebube di na nka, na unu onwe-unu amataghi ebe O si puta, ma Ọ meghere anyam.


bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n'ihi na Chineke soro Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan