Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 6:46 - Bible Nso

46 Mb͕e O kelesiri ha, O jere n'ugwu ahu ikpe ekpere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

46 Mgbe ndị a niile lachara, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 6:46
9 Iomraidhean Croise  

Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ rigoro n'elu ugwu ahu iche ikpe ekpere: ma mb͕e o ruru anyasi, nání Ya nọ n'ebe ahu.


Ma gi onwe-gi, mb͕e ọ bula i nēkpe ekpere, bà n'ime-ulo ntà gi, mb͕e i mechisi-kwa-ra uzọ-gi, kpere Nna-gi Nke di na nzuzo, Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi.


O we bilie n'isi-ututu, n'ezi abali, pua, je n'ebe bu ọhia, nọ nēkpe ekpere n'ebe ahu.


Mb͕e o ruru anyasi, ub͕ọ ahu we di n'etiti oké osimiri, nání Ya onwe-ya nọ kwa n'ala.


O rue n'ubọchi ndia, na Ọ puru rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere; O we nọgide n'ogologo abali ahu nile n'ikpe ekpere nye Chineke.


Mb͕e Pọl nọgidesiri ọtutu ubọchi ọzọ, ọ kele umu-nna nime Kraist ekele ikpe-azu, we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ ije Siria, Prisila na Akwila soro kwa ya; mb͕e ọ kpachasiri agiri-isi-ya na Kenkrei: n'ihi na ọ kwereri Chineke nkwa.


ma mb͕e o kelesiri ha ekele ikpe-azu, si kwa, M'gālaghachikute unu ọzọ, ma Chineke kwe, o si n'Efesọs nupu ub͕ọ.


mọm adighi nfé ma-ọli, n'ihi na ahughi m Taitọs nwa-nnam: kama ekelerem ha ekele ikpe-azu, we pua je Masedọnia.


N'ihi na akpọrọ unu ime nka: n'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu n'ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ije-ukwu-Ya nile:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan