Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 6:34 - Bible Nso

34 O we puta, hu oké ìgwé madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, n'ihi na ha di ka aturu nēnweghi onye nāzù ha: O we malite izí ha ọtutu ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, nʼihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ malitekwara izi ha ọtụtụ ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 6:34
19 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n'ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n'ulo-ya n'udo.


Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n'ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n'ulo-ya n'udo.


Ọ gēru kwa, na ha gēche iru, onye ọ bula n'ebe ndi-ya nọ, ha gāb͕alaga kwa, onye ọ bula rue ala-ya, dika mb͕ada anāchu achu, na dika ìgwè ewu na aturu, nke ọ nādighi onye nāchikọta ha.


Ìgwè ewu na aturu nāla n'iyì ka ndim buworo: ndi-ọzùzù-aturu-ha emewo ka ha kpafue, n'ugwu di iche iche ka ha meworo ka ha laghachi azu: site n'ugwu rue ugwu ntà ka ha jeworo, ha echezọwo ebe-nmakpu-ha.


Ha we b͕asa, n'ihi na onye-ọzùzù-aturu anọgh: ha we ghọrọ anu ọhia nile ihe-oriri, we b͕asa.


N'ihi na teraphim ekwuwo ajọ ihe, ndi nāju ase ahuwo ọhù ugha; ọ bu kwa nrọ ugha ka ha nēzi, n'efu ka ha nākasi madu obi: n'ihi nka ka ha buliworo ije dika ìgwè ewu na aturu, anēweda ha n'ala, n'ihi na ọ dighi onye-ọzùzù-aturu ha nwere.


onye ganāpu apu n'iru ha, onye ganābà kwa abà n'iru ha, onye ganēme kwa ka ha nāpu apu, onye ganēme kwa ka ha nābà abà; ka nzukọ Jehova we ghara idi ka ìgwè ewu na aturu nke nēnweghi onye-ọzùzù.


O we puta, hu oké ìgwè madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, me ndi-nriaria-ha ka aru-ha di ike.


Jisus we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si, Enwerem ọmiko n'aru ìgwè madu a, n'ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri: ma achọghm izilaga ha n'ọnu efu, ka ha ghara ida #mbà n'uzọ ma eleghi anya.


Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu nile, O nwere ọmiko n'aru ha, n'ihi na anēsob͕u ha, nāchusa kwa ha, dika aturu nēnweghi onye nāzù ha.


Ma ọtutu madu huru ha mb͕e ha nēje, ha mata-kwa-ra ha, we si n'obodo ahu nile b͕akọta n'ebe ahu n'ukwu ala, buru ha uzọ.


Mb͕e chi nēji nb͕u a, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si, Ebe a bu ọhia, chi nēji kwa ub͕u a:


Na mb͕e ahu, mb͕e oké ìgwè madu di kwa ọzọ, mb͕e ha nēnweghi kwa ihe ha gēri, Ọ kpọrọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, si ha,


Enwerem ọmiko n'aru ìgwè madu a, n'ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri:


Ma mb͕e ìgwè madu nile mara ya, ha soro Ya: O we nara ha nke-ọma, we gwa ha okwu bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi ọ di nkpà ka eme ka aru-ha di ike.


O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.


N'ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n'adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n'ihe nile n'otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan