Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 6:3 - Bible Nso

3 Nwoke a, Ọ̀ bughi onye-ọ̀kà ahu, nwa Meri, na nwa-nne Jemes, na Joses, na Judas, na Saimon? umu-nne-Ya ndinyom, hà anọghi kwa n'ebe a n'etiti ayi? Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Onye a ọ bụghị onye kapinta ahụ? Ọ bụghị nwa Meri, bụrụkwa nwanne Jemis, Josef, Judas na Saimọn? Ụmụnne ya ndị inyom ha esoghị anyị nọrọ nʼebe a?” Iwe were ha nʼebe ọ nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 6:3
21 Iomraidhean Croise  

Otú a ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa Israel na Onye Nsọ ya, siri onye madu nēleda, onye bu ihe-árú nke mba nka, onye bu orù ndi nāchi achi: Ndi-eze gāhu, we kpọ isi ala; n'ihi Jehova Nke kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye Nsọ nke Israel, Nke rọputaworo gi.


Ngọzi nādi-kwa-ra onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n'ọnyà n'arum.


Mb͕e Ọ nọ nāgwa ìgwè madu nile okwu, le, nne-Ya na umu-nne-Ya guzoro n'èzí, nāchọ igwa Ya okwu.


Ndinyom di kwa ndi nọ n'ebe di anya nēkiri: n'etiti ha ka Meri Magdalini, na Meri nne Jemes nke-ntà na Joses, na Salomi, nọ;


na Andru, na Filip, na Batọlọmiu, na Matiu, na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs, na Saimon Kananaiọs,


Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide;


Ngọzi nādikwara onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n'ọnyà n'arum.


Ewe si Ya, Nne-gi na umu-nne-gi nēguzo n'èzí, nāchọ ihu Gi anya.


Judas (ọ bughi Iskariot) si Ya, Onye-nwe-ayi, Gini putaworo na I gaje iwere Onwe-gi gosi ayi, ma ọ bughi uwa?


Ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Jisus, Nwa Josef, Onye ayi onwe-ayi mara nna-Ya na nne-Ya? Ò si aṅa kwue ub͕u a, Esiwom n'elu-igwe ridata?


Mb͕e ha batara n'obodo, ha we rigo n'ime-ulo di n'elu ulo, ebe ha nānọ; Pita na Jọn na Jemes na Andru, Filip na Tomas, Batọlọmiu na Matiu, Jemes nwa Alfiọs, na Saimon Zilotis, na Judas nwa Jemes.


Ma mb͕e o kpukpusiri ha aka ikpuchi ọnu-ha, ọ kọrọ ha otú Onye-nwe-ayi duputara ya-ri n'ulo-nkpọrọ. Ọ si, Kọrọ Jemes na umu-nna-ayi ihe ndia. O we pua, ga ebe di iche.


ma ayi onwe-ayi nēkwusa Kraist, na akpọgidere Ya n'obe, Onye buru ndi-Ju ọnyà, buru kwa ndi mba ọzọ ihe-nzuzu;


Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike iri ihe na iṅu ihe?


Ma ahughm onye ọzọ n'etiti ndi-ozi, ma ọ bu nání Jemes nwa-nne Onye-nwe-ayi.


Onye unu nābiakute, bú nkume di ndu, Nke madu juru n'ezie, ma n'ebe Chineke nọ Ọ bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru,


Judas, orù nke Jisus Kraist, na nwa-nne Jemes, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi akpọworo, ndi ahuru n'anya nime Chineke, bú Nna-ayi, ndi edebewo kwara Jisus Kraist:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan