Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 6:15 - Bible Nso

15 Ma ndi ọzọ si, Ọ bu Elaija. Ndi ọzọ si kwa, Ọ bu onye-amuma, dika otù nime ndi-amuma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ Ịlaịja.” Ma ndị ọzọkwa kwuru na ọ bụ onye amụma dị ka otu nʼime ndị amụma mgbe ochie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 6:15
19 Iomraidhean Croise  

Le, Mu onwem nēzitere unu Elaija, bú onye-amuma, tutu oké ubọchi ahu di egwu nke Jehova abia.


Ha we si, Ufọdu si, Jọn Baptist; ma ndi ọzọ si, Elaija: ma ibe-ha si, Jeremaia, ma-ọbu otù nime ndi-amuma.


Ìgwè madu ahu we nāsi, Nwoke a bu Onye-amuma ahu, Jisus, Nke si na Nazaret nke Galili bia.


Ma mb͕e Herod nuru ya, ọ si, Jọn, onye mu onwem bipuru isi-ya, emere onye ahu ka o si n'ọnwu bilie.


Ha we gwa Ya, si, Jọn Baptist: ndi ọzọ si kwa, Elaija; ma ndi ọzọ si, Otù nime ndi-amuma.


Ya onwe-ya gāga kwa n'iru Ya nime mọ na ike Elaija, ime ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ime kwa ka ndi nānughi ihe chigharia iga n'uche ndi ezi omume; idozi nye Onye-nwe-ya otù ndi nke akwadebeworo Ya.


Madu nile we tua egwu: ha we nye Chineke otuto, si, Onye-amuma uku ebiliwo n'etiti ayi: ha si kwa, Chineke eletawo ndi-Ya.


Ma mb͕e onye-Farisi nke kpọrọ Ya huru ya, o kwue n'onwe-ya, si, Nwoke a, asi na Ọ bu onye amuma, Ọ gāmara onye nwanyi a bu nke nēmetu Ya aka, na aha madu ọ bu, na ọ bu onye-nmehie.


Ha we za, si, Jọn Baptist; ma ndi ọzọ si, Elaija: ma ndi ọzọ si, na otù onye nime ndi-amuma ochie esiwo n'ọnwu bilie ọzọ.


ufọdu si-kwa-ra, na Elaija aputawori ihè; ndi ọzọ si-kwa-ra na otù onye nime ndi-amuma ochie esiwori n'ọnwu bilie ọzọ.


Ha we jua ya, si, Ì bu gini kwa? Gì onwe-gi bu Elaija? Ọ si, Abughi m. Gì onwe-gi bu onye-amuma ahu? O we za, si, É-è.


Ha we jua ya, si ya, Ọ̀ bu kwa gini mere i nēme baptism, ma ọ buru na gi onwe-gi abughi Kraist ahu, ma i bughi Elaija, ma i bughi onye-amuma ahu?


Ya mere mb͕e ndi ahu huru ihe-iriba-ama O mere, ha siri, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu nke nābia n'uwa.


Ya mere ufọdu nime ìgwè madu ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia, ha si, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu.


Ya mere ha si onye-ìsì ahu ọzọ, Gini ka gi onwe-gi nēkwu bayere Ya, n'ihi na O meghere anya-gi? Ọ si, Ọ bu onye-amuma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan