Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 5:29 - Bible Nso

29 Ngwa ngwa isi ọbara-ya kọsia; o we mara n'aru-ya na emere ya ka aru di ya ike n'ajọ ọria ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Ngwangwa oruru ọbara ya kwụsịrị. Ọ matakwara nʼime onwe ya na ya enwerela onwe ya site nʼọrịa ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 5:29
14 Iomraidhean Croise  

Mb͕e oké unwu gādi n'ala, mb͕e ajọ ọria nke nēfe efe gādi, mb͕e nchakpọ gādi, ma-ọbu ọmuma-ebu, ma-ọbu igurube, ma-ọbu ọbubu; mb͕e onye-iro-ha gānọchigide ha n'agha n'ala nke ọnu-uzọ-ama nile ha; ihe-otiti ọ bula, ọria ọ bula;


Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile;


O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma, O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha.


Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu, Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha.


Jehova, bú Chinekem, Etikurum, I, I we me ka m'diri ndu.


si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.


Ma ọ buru na onye-nchu-àjà abata nime, le anya, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n'ulo ahu, mb͕e etesiri ulo ahu; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ulo ahu di ọcha, n'ihi na emewo ka ihe-otiti ahu la.


Nwoke ọ bula nke ya na nwayi nke nāsọ uba nēdina, nke gēkpughe kwa ọtọ-ya; isi ọbara nwayi ahu ka ọ b͕abaworo ọtọ, nwayi ahu ekpughewo kwa isi ọbara nke ya onwe-ya: agēbipu kwa ha abua n'etiti ndi-ya.


Ma le, otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, biara n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka:


n'ihi na O mereri ka aru ọtutu madu di ike; ya mere na ha dagidere Ya ka ha metu Ya aka, ka ha ra, bú ndi ajọ ọria di iche iche di n'aru.


N'ihi na ọ nāsi, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam.


Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo, si n'ajọ ọria-gi nwe aru di ike.


N'oge hour ahu O mere ka aru ọtutu madu di ike site n'ọria na ajọ ọria di iche iche na ndi ajọ mọ; O were kwa amara me ka ọtutu ndi-ìsì hu uzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan