17 Ha we malite iriọ Ya ka Ọ pua n'ókè-ala-ha.
17 Mgbe ahụ, ha bidoro ịrịọ Jisọs ka ọ pụọra ha nʼakụkụ ala ha.
Abimelek we si Aisak, Si n'ebe ayi nọ la; n'ihi na i nwe ume kari ayi nke-uku.
Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua?
Ma le, obodo ahu nile putara izute Jisus: ma mb͕e ha huru Ya, ha riọrọ Ya ka Ọ pua n'ókè-ala-ha.
si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? Amataram gi Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke.
mb͕e o tisiri nkpu n'oké olu, o we si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? Ewerem Chineke b͕a Gi iyi, emekpalam aru.
Ma mb͕e Saimon Pita huru ya, o we da n'ala n'ikperè Jisus, si, Si n'ebe m'nọ pua; n'ihi na abum onye-nmehie, Onye-nwe-ayi.
Ọra nile nke ala ndi Gerasa di ya gburugburu we kpere Ya ka O si n'ebe ha nọ la; n'ihi na ha nātu oké egwu: O we ba nime ub͕ọ, laghachi.
ha we bia riọ ha; mb͕e ha duputasiri ha, ha we kpere ha ka ha si n'obodo-ha pua.
Ma ub͕u a, n'ìhi gini ka ayi gānwu? n'ihi na ọku uku a gēripia ayi: ọ buru na ayi onwe-ayi anu kwa olu Jehova, bú Chineke-ayi, ọzọ, ayi gānwu kwa.