33 O nēji kwa ọtutu ilu di otú a gwa ha okwu Chineke, dika ha puru inu ya:
33 O jiri ọtụtụ ilu yiri ndị a gwa ha okwu dị ka ha pụrụ ịghọta.
O we gwa ha ọtutu okwu n'ilu di iche iche, si, Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru;
ma mb͕e ọ bula aghara ya, o tó, ghọ ihe bùkari ihe nile anāku n'ubi, o we waputa oké alaka; nke mere ka anu-ufe nile nke elu-igwe pu inọ n'okpuru ǹdò-ya.
ma asi na O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu: ma mb͕e Ya na ha nọ iche Ọ nākọrọ ndi nke Ya nēso uzọ-Ya ihe nile.
Enwerem ọtutu ihe ọzọ igwa unu, ma unu apughi ibūru ha ub͕u a.