Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 4:31 - Bible Nso

31 Ọ di ka nkpuru mustard, nke, mb͕e ọ bula aghara ya n'ala, ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile di n'ala;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Ọ dị ka mkpụrụ mọstaadị, nke bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta nke a na-akụ nʼala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 4:31
30 Iomraidhean Croise  

N'ihi nka ka M'gēkère ya òkè n'etiti ndi bara uba, o gēso kwa ndi nwere ume kèsa ihe ọ kwatara n'agha; n'ihi na ọ b͕apuru nkpuru-obi-ya dika miri nye ọnwu, ọ bu kwa na ndi-njehie ka aguru ya: ma ya onwe-ya bupuru nmehie ọtutu madu, ọ bu kwa ndi-njehie ka ọ nāriọrọ aririọ.


N'ihi na o tolitere n'iru Ya dika ome, na dika nkpọrọgwu nke putara n'ala kpọrọ nku: ọ dighi udi-aru oma ọ nwere, ọ dighi kwa ima-nma; ayi we hu ya, ma ọ maghi nma n'ile ya anya nke ayi gēji chọsie ya ike.


Onye ntà n'etiti ha gāghọ nnù abua na ọgu iri, onye dikarisiri ntà gāghọ kwa mba nwere ume: Mu onwem, Jehova, gēme ka ọ bia ọsọsọ na mb͕e-ya.


Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.


N'ubọchi ahu ka Jehova gēb͕ochi ndi bi na Jerusalem; onye nāsu ngọngọ n'etiti ha n'ubọchi ahu gādi kwa ka Devid; ulo Devid gādi kwa ka Chineke, dika mọ-ozi nke Jehova n'iru ha.


Ọtutu mba gārapa-kwa-ra na Jehova n'ubọchi ahu, ghọ-kwa-ram otù ndi: M'gēbi kwa n'etiti gi, i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute gi.


N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


O we si, Ayi gēsi aṅa tunyere ala-eze Chineke? ma-ọbu n'ìlu gini ka ayi gātu ya?


ma mb͕e ọ bula aghara ya, o tó, ghọ ihe bùkari ihe nile anāku n'ubi, o we waputa oké alaka; nke mere ka anu-ufe nile nke elu-igwe pu inọ n'okpuru ǹdò-ya.


Onye-nwe-ayi we si, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi osisi sycamine nka, Ka eropu gi, ku kwa gi n'oké osimiri; ọ gāṅa kwa unu nti.


Otú a ka okwu Onye-nwe-ayi were ike nāga n'iru n'iru nādi kwa irè.


Ya mere ndi nāra okwu-ya nke-ọma, emere ha baptism: n'ubọchi ahu ewe tukwasiri ha ihe ra ka nnù madu asa na ọgu iri.


Mb͕e ha nuru ya, ha we nye Chineke otuto, ha we si ya, Nwa-nna-ayi, i huwo ka ha ra, bú ọtutu madu riri nne n'etiti ndi-Ju ndi kweworo na Jisus; obi ha nile nānu kwa ọku nye iwu-ayi:


Ma ọtutu n'etiti ndi nuru okwu-ha kwere; ọnu-ọgugu ndikom ahu we rue ihe ra ka nnù iri na nnù abua na ọgu iri.


ewe tukwasi kari nye Onwe-nye-ayi ndi kwere na Ya, ìgwè madu ma ndkom ma ndinyom;


Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan