Oziọma Mak 4:19 - Bible Nso19 ma ncheb͕u nile nke oge a, na aghughọ nke àkù, na nbata nke agu ihe di iche iche ọzọ, nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a19 ma nchekasị nke ndụ a, na nghọgbu nke akụnụba, na oke ọchịchọ, nakwa ihe ndị ọzọ na-abata, kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. Faic an caibideil |
Ọ di otù onye nke nání ya di, ọ dighi kwa onye abua ọ nwere; ọ dighi kwa nwa ma-ọbu nwa-nne o nwere; ma ọ dighi nsọtu diri ndọb͕u-ya nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, afọ adighi-eju kwa anya-ya n'àkù. Ọ nāsi, Ọ̀ bu kwa n'ihi onye ka mu onwem nādọb͕u onwem n'ọlu, we me ka ezi ihe kọnari nkpuru-obim? Nka bu kwa ihe-efu, e, nweda-n'ala jọrọ njọ ka ọ bu.