Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 4:15 - Bible Nso

15 Ma ndia bu ndi nọ n'akuku uzọ ahu, ebe anāgha okwu ahu; ma mb͕e ọ bula ha nuru, ngwa ngwa Setan abia, we napu okwu nke aghaworo nime ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Mmadụ ụfọdụ dị ka mkpụrụ ndị ahụ dara nʼakụkụ ụzọ, ebe a kụrụ okwu ahụ. Ngwangwa ha nụrụ ya, ekwensu na-abịa napụ ha okwu ahụ nke a kụrụ nʼime ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 4:15
28 Iomraidhean Croise  

Lot we pua, gwa di umu-ya, ndi nālu umu-ya ndinyom, okwu, si, Bilienu, si n'ebe a pua; n'ihi na Jehova nēbibi obodo a. Ma ọ di ka onye nākwa emò n'anya di umu-ya.


Ònye kwere ihe ayi nuworo? ogwe-aka Jehova kwa, n'àru onye ka ekpugheworo ya?


Ọ we me ka m'hu Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, ka ọ nēguzo n'iru mọ-ozi nke Jehova, na Setan, ka o nēguzo n'aka-nri-ya imegide ya.


Mb͕e onye ọ bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma ọ ghọtaghi ya, ajọ onye ahu abia, punara ihe aghaworo n'obi-ya. Onye a bu nke aghara n'akuku uzọ.


Ma ha lefuru ya anya, je ebe nke ha, otù onye n'ubi nke aka ya, nke-ọzọ n'ihe-ahia-ya:


Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.


Ọgha-nkpuru nāgha okwu Chineke.


Otú ahu, ndia bu kwa ndi anāgha n'ebe nkume ahu, ndi, mb͕e ọ bula ha nuru okwu ahu, ngwa ngwa ha were ọṅù jide ya;


o rue, mb͕e ọ nāgha, ufọdu dara n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tuturie ha.


Ndi nọ n'akuku uzọ ahu bu ndi nuru; mb͕e ahu ekwensu bia, we napu okwu ahu n'obi-ha, ka ha ghara ikwere, ewe zọputa ha.


Ma mb͕e ha nuru okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu, ufọdu were ya me ihe-ọchì; ma ndi ọzọ siri, Ayi gānu kwa olu-gi bayere nka ọzọ.


Ma Pita siri, Ananaias, n'ìhi gini ka Setan mejuru obi-gi igwa Mọ Nsọ okwu-ugha, na idebere onwe-gi ufọdu nime ọnu-aha nke iberibe ala gi?


ka Setan we ghara irib͕u ayi: n'ihi na ayi abughi ndi nāmaghi ihe nile ọ nēchèputa.


bú onye ahu, nke ọbibia-ya di ka ilusi-ọlu-ike nke Setan n'ike nile ọ bula na ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche nke ugha,


ma ọ di onye ọ bula nke nākwa iko, ma-ọbu nke emeruru emeru, dika Isọ, onye rere di-ọkpara ya onwe-ya bu n'ọnọdu otù oriri.


N'ihi nka ayi aghaghi iṅabiga nti ókè kari n'ihe anuru, ka aghara ibupu ayi n'ebe ha di ma eleghi anya, dika miri nēbupu ub͕ọ.


Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi:


Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n'uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya.


Ekwensu ahu nke nēduhie ha, atubàra ya nime ọdọ ọku na brimstone, ebe anu-ọhia ahu na onye-amuma ugha ahu nọ kwa; agēmekpa kwa ha aru ehihie na abali rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Ma mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi, agātọpu Setan n'ulo-nkpọrọ-ya,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan