Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 3:7 - Bible Nso

7 Jisus we wezuga Onwe-ya, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, je oké osimiri: oké ọtutu madu si na Galili soro: oké ọtutu madu si kwa na Judia,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nʼebe ahụ pụọ gaa nọdụ nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ ndị sitere na Galili sooro ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 3:7
20 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e ọ bula ha sob͕uru unu n'obodo a, b͕alaga n'obodo di iche: n'ihi na n'ezie asim unu, Unu agaghi-agazù obodo nile nke Israel ma-ọli, rue mb͕e Nwa nke madu gābia.


Ma ebe Jisus mara ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya: ọtutu madu we so Ya; O we me ka aru di ha nile ike,


O we dọ ha aka na nti ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè:


Ọtutu ìgwè madu we si na Galili na Dekapọlis na Jerusalem na Judia na n'ofè Jọdan so Ya.


O we ba n'ulo-nzukọ nile ha gazue na Galili dum, nēkwusa ozi ọma nāchupu kwa ndi-mọ ọjọ.


Ma ọ puru, malite ikwusazu ya, na ifesa okwu ahu, nke mere na O nweghi ike ọzọ ibà nime obodo n'iru ọra, kama Ọ nọ n'azu obodo n'ebe bu ọhia: ha we si n'ebe nile nābiakute Ya.


Ìgwè madu we b͕akọ ọzọ, ya mere na ha apughi ọbuná iri nri.


Ọ we malite ọzọ izí ihe n'usọ oké osimiri. Oké ìgwè madu uku we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕o, we nọdu ala n'osimiri; ìgwè madu ahu nile we nọ n'usọ oké osimiri n'elu ala.


Ma ha kwusiri ike kari, si, Ọ nākwali ndi-Ju, nēzí ihe n'ebe nile di na Judia dum, nāmalite kwa site na Galili rue ebe a.


O rue n'ubọchi ndia, na Ọ puru rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere; O we nọgide n'ogologo abali ahu nile n'ikpe ekpere nye Chineke.


O we so ha rida, guzo n'ebe di lari, Ya na oké ìgwè ndi nēso uzọ-Ya, na oké ọtutu ndi- Ju ndi si na Judia nile na Jerusalem, na usọ oké osimiri nke Taia na Saidon, puta, ndi biara inu okwu-Ya, na ka ewe me ka aru-ha di ike n'ọria-ha nile;


Ndi ọzọ nāsi, Onye a bu Kraist-ayi. Ma ufọdu nāsi, Gini, ọ̀ gābu na Galili ka Kraist-ayi si bia?


Ha zara, si ya, Gì onwe-gi si kwa na Galili puta? Nyocha n'akwukwọ nsọ, le kwa na ọ dighi onye-amuma si na Galili bilie.


Ngwa ngwa umu-nna nime Kraist we zipu Pọl na Sailas n'abali igaru Beria: mb͕e ha ruru ebe ahu, ha ba nime ulo-nzukọ nke ndi-Ju.


Mb͕e ahu umu-nna nime Kraist we zipu Pọl ngwa ngwa iga rue oké osimiri: ma Sailas na Timọti nọgidere n'ebe ahu.


Ha we do obodo ndia nsọ, bú Kedesh nime Galili, n'ugwu Naftali, na Shekem n'ugwu Efraim, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron) n'ugwu Juda.


Site kwa n'ebo Naftali, Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Hamot-doa na ebe-ita-nri-ya nile, na Katan na ebe-ita-nri-ya nile; obodo atọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan