Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 3:20 - Bible Nso

20 Ìgwè madu we b͕akọ ọzọ, ya mere na ha apughi ọbuná iri nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Emesịa, ọ lọtara nʼụlọ, ma igwe mmadụ gbakọtakwara ọzọ nke mere na ha enweghị ohere iri nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 3:20
10 Iomraidhean Croise  

Ma ọ puru, malite ikwusazu ya, na ifesa okwu ahu, nke mere na O nweghi ike ọzọ ibà nime obodo n'iru ọra, kama Ọ nọ n'azu obodo n'ebe bu ọhia: ha we si n'ebe nile nābiakute Ya.


Mb͕e Ọ batara ọzọ na Kapanaum mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, ewe nu na Ọ nọ nime ulo.


na Judas Iskariot, onye ra-kwa-ra Ya nye. O we ba n'ulo.


Jisus we wezuga Onwe-ya, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, je oké osimiri: oké ọtutu madu si na Galili soro: oké ọtutu madu si kwa na Judia,


O we gwa ndi nēso uzọ-Ya okwu, ka otù ub͕o ntà di nēche Ya n'ihi ìgwè madu ahu, ka ha ghara ikpab͕u Ya:


O we si ha, Unu onwe-unu bia ichè n'ebe bu ọhia, ka unu zuru ike nke-ntà. N'ihi na ọtutu madu nābia nāla kwa, oghere adighi kwa ha ọbuná iri ihe.


Mb͕e Ọ ghara ìgwè madu ahu ba n'ulo, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya isi ilu ahu.


Mb͕e Ọ batara n'ulo-ha, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya iche, si, Gini mere ayi onwe-ayi apughi ichupu mọ ahu?


O we so ha rida, guzo n'ebe di lari, Ya na oké ìgwè ndi nēso uzọ-Ya, na oké ọtutu ndi- Ju ndi si na Judia nile na Jerusalem, na usọ oké osimiri nke Taia na Saidon, puta, ndi biara inu okwu-Ya, na ka ewe me ka aru-ha di ike n'ọria-ha nile;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan