Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 3:10 - Bible Nso

10 n'ihi na O mereri ka aru ọtutu madu di ike; ya mere na ha dagidere Ya ka ha metu Ya aka, ka ha ra, bú ndi ajọ ọria di iche iche di n'aru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Nʼihi na ọ gwọọla ọtụtụ ndị ọrịa, nke mere na ndị bu ọrịa dị iche iche na-agbalịsị ike ịmetụ ya aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 3:10
18 Iomraidhean Croise  

Ma Jehova were ihe-ọjọọ uku di iche iche tie Fero na ulo-ya n'ihi okwu bayere Serai, bú nwunye Abram.


Mb͕e anu ahu nādi n'etiti ezé-ha ub͕u a, tutu atabie ya, iwe Jehova we di ọku megide ndi Israel, Jehova we were ihe-otiti riri nne nke-uku tie ndi Israel.


Ma ebe Jisus mara ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya: ọtutu madu we so Ya; O we me ka aru di ha nile ike,


O we puta, hu oké ìgwè madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, me ndi-nriaria-ha ka aru-ha di ike.


ha nāriọ kwa Ya ka ha metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka, nání ya: ewe zọputa ha, ka ha ra, bú ndi meturu Ya aka.


Jisus we nējeghari na Galili dum, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche n'etiti ndi ahu.


Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo, si n'ajọ ọria-gi nwe aru di ike.


Ebe ọ bula Ọ batara, n'obodo ntà, ma-ọbu n'obodo, ma-ọbu n'ubi, ha we nātọb͕ọ ndi aru-ha nādighi ike n'ọma-ahia, ha nāriọ kwa Ya ka ha metu ọbuná ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ewe zọputa ha, ka ha ra, bú ndi meturu Ya aka.


Ha we bía na Betsaida. Ha we kutara Ya onye-ìsì, riọ Ya ka O metu ya aka.


O we ba n'otù nime ub͕ọ abua ahu, nke bu nke Saimon, we kpere ya ka o si n'ala nupu nke-ntà. O we nọdu, si n'ub͕ọ nēzí ìgwè madu nile ihe.


Ìgwè madu ahu nile we chọ imetu Ya aka: n'ihi na ike nēsi n'aru-Ya puta, nēme kwa ka aru di ha nile ike.


Ma aru adighi orù otù ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise mma, onye di ya oké ọnu-ahia, ọ nọ n'ọnu ọnwu.


N'oge hour ahu O mere ka aru ọtutu madu di ike site n'ọria na ajọ ọria di iche iche na ndi ajọ mọ; O were kwa amara me ka ọtutu ndi-ìsì hu uzọ.


nke mere ka ha nēkupu ọbuná ndi aru nādighi ike, nēdebe ha n'amá, tọb͕ọ ha n'ihe-ndina na ute, ka, mb͕e Pita nāga, ka ọbuná nání onyinyo-ya we kpuchie otù onye nime ha.


N'ihi na onye Onye-nwe-ayi huru n'anya ka Ọ nēzí ihe site n'inye ya ahuhu, O nāpia kwa nwa ọ bula Ọ nānata utari.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan