Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 2:24 - Bible Nso

24 Ndi-Farisi we si Ya, Le, gini mere ha nēme n'ubọchi-izu-ike ihe nēzighi ezi n'iwu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ndị Farisii siri ya, “Lee, gịnị mere ha ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 2:24
18 Iomraidhean Croise  

ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula:


Ubọchi isi ka agēje ozi; ma n'ubọchi nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike di, ọ bu ihe nsọ Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi n'ubọchi-izu-ike, aghaghi ime ka ọ nwua.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye nēme nka na nwa madu nke nējidesi ya ike bu; onye nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nēdebe kwa aka-ya ghara ime ihe ọjọ ọ bula.


N'ihi na otú a ka Jehova siri ndi-onozi ndi nēdebe ubọchi-izu-ikem nile, ndi rọputawo-kwa-ra ihe tọrọm utọ, ndi nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike:


Umu ala ọzọ kwa, ndi nārapara Jehova, ijere Ya ozi, na ihu aha Jehova n'anya, na iburu Ya ndi-orù, onye ọ bula nke nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike;


Ọ buru na i me ka ukwu-gi si n'ubọchi-izu-ike chighari, i we ghara ime ihe nātọ gi utọ n'ubọchi nsọm; ọ buru kwa na i kpọ ubọchi-izu-ike ihe-utọ, i kpọ kwa ihe nsọ nke Jehova ihe-nsọpuru; i we sọpuru ya, ghara ime ihe bu uzọ-gi nile, ghara ichọputa ihe nātọ gi utọ ma-ọbu ikwu okwu nke aka gi:


Ma ndi-Farisi, mb͕e ha huru ya, ha si Ya, Le, ndi nēso uzọ-Gi nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike.


Mb͕e ndi-ode-akwukwọ di n'etiti ndi-Farisi huru na O nēso ndi-nmehie na ndi-ọna-utu ahu eri ihe, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, Gini mere Ọ nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ahu eri ihe?


O we si ha, Ọ dighi mb͕e ọ bula unu guru ihe Devid mere, mb͕e ọ nọ na nkpà, mb͕e agu gu-kwa-ra ya, ya onwe-ya, na ndi soro ya?


si, Gini mere Nwoke a nēkwu okwu otú a? Ọ nēkwulu Chineke: ònye puru ib͕aghara nmehie, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke?


na n'ihi ya, tugharianu uche n'Onye ahu Nke tachiworo obi na nkwugide di otú a, bú nke ndi-nmehie nēkwugide onwe-ha, ka ike ghara igwu unu, unu we da #mbà na nkpuru-obi-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan