Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 15:40 - Bible Nso

40 Ndinyom di kwa ndi nọ n'ebe di anya nēkiri: n'etiti ha ka Meri Magdalini, na Meri nne Jemes nke-ntà na Joses, na Salomi, nọ;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

40 O nwere ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme, nʼetiti ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemis nke nta, na Josef, na Salomi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 15:40
18 Iomraidhean Croise  

Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim; Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya.


Filip, na Batọlọmiu; Tomas, na Matiu onye-ọna-utu; Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs;


Nwoke a, Ọ̀ bughi Nwa onye-ọ̀kà-ayi? àdighi-akpọ nne-Ya Meri? nà umu-nne-Ya ndikom, Jemes, na Josef, na Saimon, na Judas?


Ma Meri Magdalini na Meri ọzọ nọ n'ebe ahu, nānọdu na ncherita-iru ílì ahu.


Ma mb͕e ubọchi-izu-ike nāgwu, mb͕e chi ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa nābọ, Meri Magdalini na Meri ọzọ biara ile ílì ahu.


Ma Meri Magdalini na Meri nne Joses huru ebe atọb͕ọrọ Ya.


Mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri, Meri Magdalini, na Meri nne James, na Salomi, we zuta uda utọ di iche iche, ka ha we bia te Ya manu.


Ma mb͕e O siri n'ọnwu bilie n'ututu n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, O buru uzọ were Onwe-ya gosi Meri Magdalini, onye Ọ chupururi mọ ọjọ asa nime ya.


O we chọ uzọ ihu Jisus imata onye Ọ bu; ma ọ pughi n'ihi ìgwè madu, n'ihi na o toghi ogologo.


Ndi nile ndi mara Ya nke-ọma, na ndinyom ndi soro Ya site na Galili, guzokwara n'ebe di anya, nēle ihe ndia.


Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike ikuru nwunye, bú nwa-nna-nwanyi nime Kraist, jeghari, dika ndi-ozi fọduru nēme kwa, ha na umu-nne Onye-nwe-ayi, na Kifas?


Ma ahughm onye ọzọ n'etiti ndi-ozi, ma ọ bu nání Jemes nwa-nne Onye-nwe-ayi.


Jemes, orù nke Chineke na nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ebo-ayi iri na abua ndi nọ na Nb͕asa ahu, nēkele unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan