Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 15:32 - Bible Nso

32 Ka Kraist, Eze Israel, si n'elu obe ridata ub͕u a, ka ayi we hu kwere kwa. Ndi akpọgidere Ya na ha n'obe nāta kwa Ya uta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 15:32
16 Iomraidhean Croise  

Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem.


Jehova ewezugawo ikpé-gi nile, Ọ chughachiwo onye-iro-gi: Eze Israel, bú Jehova, nọ n'etiti gi: i gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọzọ.


Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.


Ya mere ọb͕ọ nile site n'Abraham rue Devid di ọb͕ọ iri na anọ; site na Devid rue mb͕e emere ka ha je biri na Babilon di kwa ọb͕ọ iri na anọ; site na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon rue Kraist di kwa ọb͕ọ iri na anọ.


Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya. Ọ bu Eze Israel; ka O si n'elu obe ridata ub͕u a, ayi gēkwe kwa na Ya.


Ndi ahu nāpunara madu ihe, ndi akpọgidere Ya na ha n'obe, nāta kwa Ya uta otù aka ahu.


Edekwasi-kwa-ra ndekwasi nke ihe eboro Ya, EZE NDI-JU.


Ha kpọgide-kwa-ra ndikom abua tinyere Ya ndi nāpunara madu ihe; otù onye n'aka-nri-Ya, na otù onye n'aka-ekpe-Ya.


Nataniel zara Ya, si, Rabai, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke; Gi onwe-gi bu Eze Israel.


ha chiri igu nkwu, pua izute Ya, we nēti nkpu, si, Hosanna: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi, bú Eze nke Israel.


N'ihi na asi na ufọdu ekweghi, gini kwa? èkweghi-ekwe-ha gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi nke Chineke ghara idi irè?


bú madu ndi hiere n'ihe bayere ezi-okwu ahu, nāsi na nbilite-n'ọnwu agabigawo ub͕u a, ha nēkpù kwa okwukwe madu ufọdu iru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan