Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 14:7 - Bible Nso

7 N'ihi na unu nwere ndi-ob͕enye n'etiti unu mb͕e nile, mb͕e ọ bula unu chọrọ unu puru ime kwa ha ihe ọma: ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Unu na ndị ogbenye na-anọ oge niile, unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọbụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 14:7
14 Iomraidhean Croise  

N'ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n'etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.


Ma Jisus siri, Rapunu ya; gini mere unu nēsob͕u ya? ọ luru ọlu ọma n'arum.


Umu-ntakiri, ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ. Unu gāchọm: dika M'gwa-kwa-ra ndi-Ju, si, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia; otú ahu ka M'nāsi unu ub͕u a.


Esirim na Nnam puta, abiawokwam n'uwa: ọzọ, anamarapu uwa, nāgakuru kwa Nnam.


Ma ub͕u a anamalakuru Onye ziterem; ọ dighi kwa onye ọ bula nime unu nājum, Òle ebe I nāla?


Anọkwaghm n'uwa ọzọ, ma ndia nọ n'uwa, Mu onwem nābiakute kwa Gi. Nna di nsọ, nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom, ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu.


Onye elu-igwe aghaghi inara nke-ọma rue oge agēme ka ihe nile di ka ha di na mbu, bù oge nke Chineke kwuru okwu bayere ha site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ ndi sitere na nmalite oge a.


N'ihi na ndi-ob͕eye agaghi-agwupu n'etiti ala: n'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I ghaghi isaghere nwa-nne-gi aka-gi, saghere onye nke gi ewedara n'ala, saghe-kwa-ra ob͕eye nke gi, n'ala-gi.


N'ihi na enwerem ọtutu ọṅù na nkasi-obi n'ihi ihu-n'anya-gi, n'ihi na obi ndi nsọ ezuwo ike site n'aka-gi, nwa-nnam.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan