Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 14:58 - Bible Nso

58 Ayi onwe-ayi nuru ka Ọ nāsi, Mu onwem gākwatu ulo nsọ a nke ejiri aka me, n'ubọchi atọ M'gēwu kwa ulo ọzọ nke anējighi aka me.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

58 “Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 14:58
11 Iomraidhean Croise  

I nọ nāhu rue mb͕e awaputara otù nkume nke anējighi aka wa, o we tie onyinyo ahu n'ukwu-ya abua nke bu ígwè na urọ, tipia ha.


N'ihi na i huru na awaputara otù nkume n'ugwu ahu nke anējighi aka wa, na o tipiara ígwè ahu na ọla ahu na urọ ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu; Chineke di uku emewo ka eze mara ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: nrọ a nēguzosi kwa ike, ọ bu kwa ihe kwesiri ntukwasi-obi ka akukọ-isi-ya bu.


si, Nwoke a siri, Apurum ikwatu ulo nsọ a nke Chineke, wu kwa ya n'ubọchi atọ.


Ufọdu we bilie, b͕a àmà ugha megide Ya, si,


Ọbuná otú a àmà-ha abughi kwa otù.


Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha, nāsi kwa, Ehe! Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ,


Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n'ubọchi atọ M'gēweli kwa ya elu.


Otú ọ di, Onye kachasi ihe nile elu adighi-ebi n'ulo eji aka wu; dika onye-amuma siri,


N'ihi na ayi matara na asi na akwaturu ulo nke uwa, bú ulo-ikwū-ayi, ayi nwere ulo ewuru nke sitere na Chineke, ulo anējighi aka wu, di ebighi-ebi, n'elu-igwe.


Ma Kraist, ebe Ọ biara ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà nke ezi ihe nile gaje ibia, O sitere n'ulo-ikwū ahu nke ka uku na nke zuru okè kari, ọ bughi nke eji aka me, nke isi-ya bu, ọ bughi nke òkìkè a,


N'ihi na Kraist abàghi n'ebe nsọ eji aka me, bú ihe-atù yiri ebe nke bu ebe nsọ n'ezie; kama Ọ bàra n'elu-igwe onwe-ya, igosi Onwe-ya n'iru Chineke n'ihi ayi ub͕u a:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan