Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 14:49 - Bible Nso

49 Kwa-ubọchi Mu na unu nọ n'ulo uku Chineke ebe M'nēzí ihe, ma unu ejideghm: ma emere nka ka ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

49 Ụbọchị niile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu, ma unu ejideghị m. Ma ihe akwụkwọ nsọ kwuru aghaghị imezu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 14:49
27 Iomraidhean Croise  

Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si,


Ihe edeworo n'akwukwọ nsọ gēsi kwa aṅa mezu, na ọ ghaghi ime otú a?


N'oge hour ahu Jisus siri ìgwè madu ahu, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe? Kwa-ubọchi M'nọduru n'ulo uku Chineke nēzí ihe, ma unu ejideghm.


Ma emewo ihe a dum, ka ihe nile ndi-amuma dere n'akwukwọ we mezu. Mb͕e ahu ndi nile nēso uzọ-Ya rapuru Ya, b͕alaga.


O we si n'ebe ahu bilie, bia n'ókè-ala Judia, ya na ofè ọzọ nke Jọdan: ìgwè madu nile we zukọ ọzọ n'ebe Ọ nọ; ka O siri eme, O we nēzí ha ihe ọzọ.


Ha we bia rue Jerusalem ọzọ: mb͕e Ọ nējeghari n'ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye we biakute Ya;


Jisus we za, mb͕e Ọ nēzi ihe n'ulo uku Chineke, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid?


Jisus we za, si ha, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe?


Ha nile we rapu Ya, b͕alaga.


O we nēzí ihe kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke. Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi nke ndi-Ju nāchọ uzọ ila Ya n'iyì:


N'ihi na asim unu, na ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu n'arum, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya: n'ihi na ihe dirim nwere ọgwugwu.


Jisus we nējeghari n'ulo uku Chineke n'ìbà Solomon.


Jisus zara ya, si, Mu onwem agwawawo uwa okwu; Mu onwem zíri ihe mb͕e nile n'ulo-nzukọ, na n'ulo uku Chineke, ebe ndi-Ju nile nāb͕akọ; ekwukwaghi m ihe ọ bula na nzuzo.


Ma n'ubọchi ikpe-azu, bú oké ubọchi nke ememe ahu, Jisus guzoro, we tie nkpu, si, Ọ buru na akpiri kpọrọ madu ọ bula nku, ya biakutem, ṅua miri.


Ya mere Jisus gwara ha okwu ọzọ, si, Mu onwem bu Ìhè nke uwa: onye nēsom agaghi-ejeghari n'ọchichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu.


O we bia kwa ọzọ n'isi-ututu n'ulo uku Chineke, ndi-Ju nile we biakute Ya; O we nọdu ala, we nēzí ha ihe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan