46 Ha we tukwasi Ya aka, jide Ya.
46 Ndị ikom ahụ jidere Jisọs ma sekpụrụ ya nʼike.
Ume nke oghere-imi-ayi, bú onye Jehova etere manu, ka ejidere n'olùlù-ha; Onye ayi siri, N'okpuru ǹdò-ya ka ayi gādi ndu n'etiti mba nile.
Mb͕e ọ biara, ngwa ngwa ọ biakutere Ya, si, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku.
Ma otù onye n'etiti ndi guzoro nso miputara mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti-ya.
Ya mere òtù ndi-agha ahu na ọchi-agha, na ndi nējere ndi-Ju ozi, jidere Jisus ke kwa Ya ab͕u,
Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi:
Ndi Filistia we jide ya, rukpọ anya-ya abua; ha we me ka ọ ridarue Geza, were ihe ọla abua ke ya ab͕u; o we buru onye nēgwe ọka n'ulo ndi ekere ab͕u.