O we bia ọbibia nke-atọ, si ha, Nārarunu ura site n'ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: o zuwo: oge hour nkem eruwo; le, anārara Nwa nke madu nye n'aka ndi-nmehie.
Ngwa ngwa, mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, biara, ya na ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nọ.