Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 13:9 - Bible Nso

9 Ma unu onwe-unu lezie anya n'onwe-unu: n'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche; n'ulo-nzukọ di iche iche ka agāpia kwa unu ihe; n'iru ndi-isi na ndi-eze ka unu gēguzo kwa n'ihim, iburu ha àmà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Unu aghaghị ịbụ ndị nọ na nche. A ga-enyefe unu nʼaka ndị na-achị achị, pịakwa unu ihe nʼụlọ ekpere. Nʼihi m, unu ga-eguzo nʼihu ndịisi ọchịchị na ndị eze dị ka ndị ama nye ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 13:9
37 Iomraidhean Croise  

ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.


si ya, Lezi anya ka i ghara igwa onye ọ bula okwu ọ bula: ma laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha nke Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà.


Ma Jisus malitere isi ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu.


N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: ala-ọma-jijiji gādi n'ebe di iche iche; oké unwu di iche iche gādi: ihe ndia bu nmalite ihe-nb͕u.


Ma ebe ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, ebe ha anughi kwa okwu-unu, mb͕e unu nāpu n'ebe ahu, tichapu ájá di n'okpuru ukwu-unu ka ọ buru ha àmà.


Ka ha ra kwa, bú ndi nānaraghi unu nke-ọma, mb͕e unu nāpu n'obodo ahu tichapu ájá di n'ukwu-unu ka ọ buru ha àmà.


Chetanu okwu Mu onwem gwara unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sob͕urum, ha gēsọb͕u kwa unu; ọ buru na ha debere okwum, ha gēdebe kwa nke unu.


Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.


O we biakute ayi, chiri ihe-ọkiké Pọl, ke onwe-ya ukwú na aka, si, Okwu ndia ka Mọ Nsọ kwuru, si, Otú a ka ndi-Ju ndi nọ na Jerusalem gēke nwoke nwe ihe-ọkiké a, ha gārara kwa ya nye n'aka ndi mba ọzọ.


Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ewe mapue ha n'obi-ha, ha we takwasi ya ikekere ezé-ha.


n'ihi na Mu onwem gēgosi ya ka ha ra, bú ahuhu nile ọ nāghaghi ihu n'ihi aham.


n'ihi na unu ka enyeworo ya n'amara n'ihi Kraist, ọ bughi nání ikwere na Ya, kama ihu kwa ahuhu n'ihi Ya:


nke bu ihe nēme ka ikpé ziri ezi nke Chineke puta ìhè; ka ewe gua unu na ndi kwesiri ala-eze Chineke, nke unu nāhu kwa ahuhu n'ihi ya:


Lezienu onwe-unu anya, ka unu we ghara ila ọlu ayi luru n'iyì, kama ka unu we nata ugwọ-ọlu zuru ezù.


Mu onwem, bú Jọn, nwa-nna-unu na onye nēso unu nwekọ nkpab͕u na ala-eze na ntachi-obi nke di nime Jisus, emere ka m'nọ n'agwe-etiti ahu nke anākpọ Patmọs, n'ihi okwu Chineke na àmà Jisus.


Atula ahuhu nile i gaje ihu egwu: le, ekwensu gaje itubà ufọdu n'etiti unu nime ulo-nkpọrọ, ka ewe nwa unu; unu gēnwe kwa nkpab͕u ubọchi iri. Gosi onwe-gi onye kwesiri ntukwasi-obi rue ọnwu, M'gēnye kwa gi okpu-eze ahu, bú ndu.


Amataram ebe i bi, bú ebe oche-eze Setan di: i nējidesi kwa aham ike, i gọnarighi kwa okwukwem, ọbuná n'ubọchi Antipas onye-àmàm, onye nkem kwesiri ntukwasi-obi, onye eb͕uru n'etiti unu, ebe Setan bi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan