N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Unu ekwela ka ndi-amuma-unu ndi nọ n'etiti unu, na ndi-unu ndi nāju arusi ase, rafue unu, unu ege-kwa-la nti nrọ nile unu nke unu onwe-unu nēme ka arọ ha.
Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iwere ihu-amam-ihe-n'anya na aghughọ efu nke ya buru onye nēzu unu n'ori, ihu-amam-ihe-n'anya nke di ka ihe-ozizí madu nyere idebe, dika ozizí mbu nke uwa, ma ọ dighi ka Kraist si di:
unu ekwela ka onye ọ bula ghọb͕ue unu n'uzọ ọ bula: n'ihi na ọ gaghi-adi, ma ọ buru na nwezuga ahu ebughi uzọ bia, ewe kpughe onye ahu nēmebi iwu, bú nwa nke ila-n'iyì,
Ndi m'huru n'anya, unu ekwela okwu mọ nile, kama nwaputanu udi-mọ ahu, ma ha bu ndi siri na Chineke puta: n'ihi na ọtutu ndi-amuma ugha apuwo ba n'uwa.