17 Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.
17 Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ.
Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n'ite; Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim.
Sameria gāhu ahuhu ikpe-ọmuma-ya; n'ihi na ọ nupuwo isi n'okpuru Chineke-ya: site na mma-agha ka ha gāda; agātupia umu-ntakiri-ha, agāb͕awa kwa ndinyom-ha di ime afọ.
Nye ha, Jehova: gini ka I gēnye? nye ha afọ nēmebi ime na ara kpọrọ nku.
ha si Ya, Ì nānu okwu umuntakiri ndia nēkwu? Jisus we si ha, E: Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru, I si n'ọnu umu ọhu na umu nāṅu ara me ka ọjija zue okè?
onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe-ya.
Ma kpenu ekpere ka ọ ghara idi na mb͕e oyi.
Ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu; n'ihi na oké nkpà gādi n'ala nka, iwe gādi-kwa-ra ndi-Ju.
N'ihi na le, ubọchi nābia, mb͕e ha gāsi, Ngọzi nādiri ndinyom àgà, na afọ nke nāmughi nwa, na ara nke nāzùghi nwa.