Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 13:14 - Bible Nso

14 Ma mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ n'efu, ka ọ nēguzo n'ebe ọ nēkwesighi (onye nāgu, ya tugharia uche), mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi ka ọ na-eguzo nʼebe ọ na-ekwesighị (onye na-agụ ya nwee nghọta), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 13:14
14 Iomraidhean Croise  

Onye-nkpab͕u ab͕asawo aka-ya n'elu ihe-utọ nile nke Jerusalem: N'ihi na ọ huwo na mba di iche iche abatawo n'ebe nsọ ya, Bú ndi I nyere iwu bayere ha na ha agaghi-abà nime nkpọkọta I nwere.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ dighi onye ala ọzọ, nke anēbighi úgwù n'obi nke anēbighi kwa úgwù n'anu-aru, gābata n'ebe nsọm, bú onye ala ọzọ ọ bula nke di n'etiti umu Israel.


Ogwe-aka ufọdu gēsite kwa n'akuku-ya guzo, me ka ebe nsọ ahu ghara idi nsọ, bú ebe ahu siri ike, ha gēwezuga kwa àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, ha gēdo kwa ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.


Ma site na mb͕e agēwezuga àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, mb͕e agēdo ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nnù ubọchi atọ na ọgu ubọchi anọ na iri gādi.


M'we nu otù onye nsọ ka ọ nēkwu, otù onye nsọ we si onye ahu nke nēkwu okwu, Rùe ole mb͕e ka ọhù a gādi, bú nke àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na njehie ahu nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, inye ma ebe nsọ ma usu-ndi-agha ka azọda ha ukwu?


Ọ gēme kwa ka otù ọb͕ub͕a-ndu siere ọtutu madu ike otù ízù: ọ bu kwa na nkera ízù ahu ka ọ gēme ka àjà na onyinye-inata-iru-ọma kwusi; ọ bu kwa n'elu nkù ihe-árú di iche iche ka otù onye nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu gābia: ọ bu kwa rue mb͕e agāwukwasi ngwusi na ihe akara àkà n'aru onye ahu nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.


Ùnu aghọtawo ihe ndia nile? Ha si Ya, E.


Umu-nnam, unu abula umu-ntakiri n'uche-unu: kama burunu umu ọhu n'obi ọjọ, ma n'uche-unu burunu ndi tozuru okè.


Ngọzi nādiri onye nāgu, na ndi nānu okwu nile nke amuma nka, ndi nēdebe kwa ihe nile edeworo nime ya: n'ihi na oge ahu di nso.


N'ebe a ka amam-ihe di. Onye nwere uche, ya gua ọnu-ọgugu nke anu-ọhia ahu; n'ihi na ọ bu ọnu-ọgugu madu: ọnu-ọgugu-ya bu kwa nnù na ọgu iri na ọgu atọ na isi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan