Oziọma Mak 13:14 - Bible Nso14 Ma mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ n'efu, ka ọ nēguzo n'ebe ọ nēkwesighi (onye nāgu, ya tugharia uche), mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu: Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a14 “Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi ka ọ na-eguzo nʼebe ọ na-ekwesighị (onye na-agụ ya nwee nghọta), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu Faic an caibideil |
Ọ gēme kwa ka otù ọb͕ub͕a-ndu siere ọtutu madu ike otù ízù: ọ bu kwa na nkera ízù ahu ka ọ gēme ka àjà na onyinye-inata-iru-ọma kwusi; ọ bu kwa n'elu nkù ihe-árú di iche iche ka otù onye nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu gābia: ọ bu kwa rue mb͕e agāwukwasi ngwusi na ihe akara àkà n'aru onye ahu nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.