Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 12:5 - Bible Nso

5 O we ziga onye ọzọ; ha we b͕ue onye ahu: na ọtutu ndi ọzọ; ha nāpia ufọdu ihe, nēb͕u kwa ufọdu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 O zigakwara onye ọzọ, ma ha gburu ya. O zigakwara ọtụtụ ndị ozi, ma ha gburu ụfọdụ, tie ndị ọzọ ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 12:5
11 Iomraidhean Croise  

Ma I nēme ka ọtutu arọ di ogologo n'isi ha, I we were Mọ-Gi b͕a àmà megide ha site n'aka ndi-amuma-Gi: ma ha aṅaghi nti: I we nye ha n'aka ndi di iche iche nke ala ọzọ.


ma ndi fọduru jidere ndi-orù-ya, me ha ihe-ihere, b͕u kwa ha.


Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!


Ṅurianu ọṅu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n'ihi na ugwọ-ọlu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú a ka ha sob͕uru ndi-amuma ndi buru unu uzọ.


Ọzọ kwa o we zigara ha orù ọzọ; ha we tiwa isi onye ahu, me ya ihe-ihere.


O nwere otù onye fọduru, bú ọkpara ọ huru n'anya: o zigara ya ikpe-azu jekuru ha, si, Ha gāsọpuru ọkparam.


Ma asim unu, na Elaija abiawo, ha me-kwa-ra ya ka ihe ha chọrọ ra, dika edeworo okwu bayere ya n'akwukwọ nsọ.


Nwenu obi-ebere, dika Nna-unu nwere obi-ebere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan