Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 12:10 - Bible Nso

10 Ùnu agughi ọbuná ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ; Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ọ bụ na unu agụbeghị akwụkwọ nsọ a na-asị, “ ‘Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ abụrụla nkume isi ntọala ụlọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 12:10
17 Iomraidhean Croise  

n'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri, Le, abum onye tọworo ntọ-ala na Zaion, bú otù nkume, nkume nke ọnwunwa, nkume-nkuku di oké ọnu-ahia nke bu ntọ-ala siri ike: onye nēkwere agaghi-ewere ọsọsọ b͕alaga.


Ma Ọ siri ha, Ùnu agughi ihe Devid mere, mb͕e agu guru ya, na ndi soro ya;


O we za, si, Ùnu agughi na Onye kère ha site na nmalite mere ha nwoke na nwayi,


ha si Ya, Ì nānu okwu umuntakiri ndia nēkwu? Jisus we si ha, E: Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru, I si n'ọnu umu ọhu na umu nāṅu ara me ka ọjija zue okè?


Jisus si ha, Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo: Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere, Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi?


Ma n'okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu, ùnu agughi okwu Chineke gwara unu, si,


Ma n'okwu bayere ndi nwuru anwu, na anēme ka ha si n'ọnwu bilie; ùnu agughi n'akwukwọ Moses, n'ebe edere okwu bayere Osisi ntà, otú Chineke gwara ya, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob?


Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme? ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ.


Ma mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ n'efu, ka ọ nēguzo n'ebe ọ nēkwesighi (onye nāgu, ya tugharia uche), mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu:


O we si ha, Ọ dighi mb͕e ọ bula unu guru ihe Devid mere, mb͕e ọ nọ na nkpà, mb͕e agu gu-kwa-ra ya, ya onwe-ya, na ndi soro ya?


Jisus we za ha, si, Ùnu agughi ọbuná ihe a, nke Devid mere, mb͕e agu guru ya, ya onwe-ya na ndi soro ya;


dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, anamatọb͕ọ nime Zaion nkume nke isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà: Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya n'iru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan