30 Baptism nke Jọn, ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na ò sitere n'aka madu? zanum.
30 Baptizim nke Jọn, o sitere nʼeluigwe ka ọ bụ nʼaka mmadụ? Gwanụ m.”
Ma Jisus siri ha, M'gāju unu otù okwu, unu zakwam, emesia M'gāgwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.
Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gasi, N'ìhi gini kwa ka unu nējighi kwe ya?
Ma asim unu, na Elaija abiawo, ha me-kwa-ra ya ka ihe ha chọrọ ra, dika edeworo okwu bayere ya n'akwukwọ nsọ.
M'si kwa unu ub͕u a, Wepunu aka n'aru madu ndia, rapu-kwa-nu ha: n'ihi na ọ buru na ìzù a ma-ọbu ọlu a sitere n'aka madu agākwatu ya n'ala: