Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 11:23 - Bible Nso

23 N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke gāsi ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri; nke nāgaghi-enwe obi abua, kama o kwere na ihe ọ nēkwu nēme; ọ gādiri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 11:23
11 Iomraidhean Croise  

Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ; Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.


Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya n'ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n'obodo ahu nile so Ya n'ukwu ala.


O we si ha, N'ihi okwukwe ntà unu: n'ihi na n'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi ugwu a, Si n'ebe a gabiga n'ebe ahu; ọ gāgabiga kwa; ihe ọ bula agaghi-adi kwa nke unu nāpughi ime.


Jisus we za, si ha, N'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe, ghara inwe obi abua, ọ bughi nání ihe emere osisi fig nka ka unu gēme, ma ọ buru na unu gāsi ọbuná ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri, agēme ihe ahu.


Onye-nwe-ayi we si, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi osisi sycamine nka, Ka eropu gi, ku kwa gi n'oké osimiri; ọ gāṅa kwa unu nti.


Ihe ọ bula unu gāriọ kwa n'aham, ihe ahu ka M'gēme, ka ewe nye Nnam otuto nime Ọkpara-Ya.


Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, riọnu ihe o bula unu nāchọ, agēme-kwa-ra unu ya.


Asi kwa na enwerem onyinye ibu-amuma, mata kwa ihe-omimi nile na ihe-ọmuma nile; asi kwa na enwerem okwukwe nile, nke mere m'gēnwe ike ibubiga ugwu, ma enweghi m ihu-n'anya, abughm ihe ọ bula.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan