19 Mb͕e ọ bula o ruru anyasi Ọ nēsi n'obodo apu.
19 Mgbe uhuruchi bịara, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya siri nʼobodo ahụ pụọ.
O we rapu ha, si n'obodo ahu pua je Betani, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.
O we ba Jerusalem, n'ulo uku Chineke; mb͕e O lesiri ihe nile anya buruburu, ebe ọ bu mb͕e anyasi ub͕u a, O we pua je Betani, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu.
Kwa-ubọchi O nēzí ihe n'ulo uku Chineke; kwa-abali Ọ nāpu, nānọ ọnọdu-abali n'ugwu anākpọ ugwu Olive.
Mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, kwerenu n'Ìhè ahu, ka unu we ghọ umu Ìhè. Ihe ndia ka Jisus kwuru, O we je zonari ha Onwe-ya.