Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 11:1 - Bible Nso

1 Mbe ha nābiaru Jerusalem nso, rue Betfagi na Betani nso, n'uzọ ugwu Olive, o we ziga madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji na Betani nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 11:1
14 Iomraidhean Croise  

Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá.


Ukwu-Ya abua gēguzo kwa n'ubọchi ahu n'elu ugwu Olive, nke di n'iru Jerusalem n'Iru-anyanwu, ugwu Olive gāb͕awa kwa n'etiti abua ya n'akuku Ọwuwa-anyanwu na n'akuku Ọdida-anyanwu, oké ndagwurugwu di uku ewe di; nkera ugwu ahu gāpuzuga n'akuku Ugwu, nkera-ya n'akuku Ndida.


O we rapu ha, si n'obodo ahu pua je Betani, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.


Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya iche, si, Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi, na nke ọgwugwu oge a?


Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.


si ha, Jenu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu: ngwa ngwa mb͕e unu nābà nime ya, unu gāhu nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasighi; tọpunu ya, sekputa ya.


Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive na ncherita-iru ulo uku Chineke, Pita na Jemes na Jọn na Andru we jua Ya iche, si,


O we zipu madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Jenu n'obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute kwa unu: sonu ya;


Ọ we kpọ ndi-ozi iri na abua ahu biakute Ya, O we malite izipu ha abua abua; O nye-kwa-ra ha ike n'ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ;


Mb͕e ahu ha siri n'ugwu anākpọ Olivet, nke di Jerusalem nso, ije nke otù ubọchi-izu-ike, laghachi na Jerusalem.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan