Ma ha juru Gi aju, nupu isi megide Gi, tufue iwu-Gi n'azu ha, b͕ue ndi-amuma-Gi ndi b͕ara àmà megide ha ime ka ha chigharikute Gi, ha we me oké ihe-nlelì.
Ndi kwesiri olu ike na ndi anēbighi úgwù n'obi na nti, unu onwe-unu nālu ọ̀gù megide Mọ Nsọ mb͕e nile: dika nna-unu-hà mere, otú ahu ka unu onwe-unu nēme.
Mb͕e nwoke gāluru nwunye, we buru di-ya, ọ gēru kwa, ọ buru na nwayi ahu ahutaghi amara n'iru ya, n'ihi na ọ huwo ihe nēkwesighi ekwesi n'aru ya, na ọ gēdere ya akwukwọ nkewa, we nye ya n'aka, we zipu ya n'ulo-ya.
N'ihi na mu onwem amawo nnupu-isi-gi, na nkwesi-olu-ike-gi: le, mb͕e m'nānọ ndu n'etiti unu ta, unu aburuwo ndi nānupu isi n'okpuru Jehova; ùnu gēsi aṅa ghara inupu isi kari nke-uku mb͕e ọnwum gasiri?