Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 10:47 - Bible Nso

47 Mb͕e ọ nuru na ọ bu Jisus Onye Nazaret, o we malite íti nkpu, na isi, Nwa Devid, Jisus, merem ebere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

47 Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, “Jisọs, nwa Devid, meere m ebere!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 10:47
24 Iomraidhean Croise  

Ome gēsi kwa n'ogwe-osisi Jesi puta, otù alaka nke sitere na nkpọrọgwu-ya gāmi kwa nkpuru:


Akwukwọ osuso-ọmumu Jisus Kraist, Nwa Devid, nwa Abraham.


Ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile n'aru, ha we si, Nwoke a, Ọ̀ gābu nwa Devid?


Ma le, otù nwanyi Kenean siri n'ókè-ala ahu puta, tie nkpu, si, Merem ebere, Onye-nwe-ayi, Nwa Devid; mọ ọjọ nējisi nwam nwanyi ike.


we bia biri n'obodo anākpọ Nazaret: ka okwu ekwuru site n'ọnu ndi-amuma we mezu, na agākpọ Ya Onye Nazaret.


Ma le, ndi-ìsì abua ndi nānọdu n'akuku uzọ, mb͕e ha nuru na Jisus nāgabiga, ha tie nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.


Ìgwè madu ahu we nāsi, Nwoke a bu Onye-amuma ahu, Jisus, Nke si na Nazaret nke Galili bia.


Ìgwè madu nile ndi nāga n'iru Ya, ndi nēso kwa, nēti nkpu, si, Hosanna diri Nwa Devid: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi; Hosanna n'ebe kachasi ihe nile elu.


Ma mb͕e ọ puru je n'uzọ-nbata, nwa-ab͕ọghọ ọzọ huru ya, ọ si ndi nọ n'ebe ahu, Nwoke a na Jisus Onye Nazaret nọ-kwa-ra.


Mb͕e Jisus nēsi n'ebe ahu nāga, ndi-ìsì abua we so Ya, nēti nkpu, si, Mere ayi ebere, Nwa Devid.


si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? Amataram gi Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke.


O we bia rue Nazaret, ebe azuputara Ya, O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, dika Ọ nēme mb͕e dum, O we bilie igu akwukwọ.


Nataniel we si ya, Ọ̀ di ezi ihe ọ bula puru isi na Nazaret puta? Filip si ya, Bia le.


Pailat we de kwa ihe-ndekwasi, debe ya n'elu obe-Ya. Ma ihe edeworo bu, Jisus ONYE NAZARET EZE NDI-JU.


Ndi ọzọ nāsi, Onye a bu Kraist-ayi. Ma ufọdu nāsi, Gini, ọ̀ gābu na Galili ka Kraist-ayi si bia?


Ha zara, si ya, Gì onwe-gi si kwa na Galili puta? Nyocha n'akwukwọ nsọ, le kwa na ọ dighi onye-amuma si na Galili bilie.


n'ihi na ayi anuwo ya ka ọ nāsi, na Jisus nka, bú Onye Nazaret, gākwatu ebe a, nwo kwa ọme-n'ala nile nke Moses rara nye ayi n'aka.


Mu onwem, bú Jisus, zitere mọ-ozim iwere ihe ndia b͕ara unu àmà nye nzukọm nile. Mu onwem bu nkpọrọgwu Devid, buru kwa nwa ọ muru, kpakpando nēnwu enwu, nke bu kwa kpakpando ututu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan