Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 10:32 - Bible Nso

32 Ma ha nọ n'uzọ, nārigoro Jerusalem; Jisus we nāga n'iru ha: ibobo nwu-kwa-ra ha n'aru; ma ndi nēso Ya nātu egwu. O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya ọzọ, malite igwa ha ihe nile gaje ime Ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Ha nọ nʼụzọ na-aga Jerusalem, ma Jisọs nọ nʼihu ha, nke a juru ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Otu a kwa, ndị mmadụ niile na-abịa ha nʼazụ tụkwara egwu. Ọzọkwa, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ nʼakụkụ, malite ịgwa ha ihe gaje ịdakwasị ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 10:32
12 Iomraidhean Croise  

Biko, nuru, gi Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, gi onwe-gi na ndi-ibe-gi ndi nānọdu ala n'iru gi; n'ihi na ndi bu ihe-ebube ka ha bu: n'ihi na, le, M'gaje ime ka orùm, bú Ihe-opupú ahu, puta ìhè.


N'oge ahu Jisus zara, si, Ekelem I, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu:


O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu.


Ibobo we nwua ha nile n'aru, nke mere ka ha jurita onwe-ha, si, Gini bu nka? ozizí ọhu! ọ bu n'ike ka Ọ nēnye ọbuná ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha nāṅa kwa Ya nti.


ma asi na O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu: ma mb͕e Ya na ha nọ iche Ọ nākọrọ ndi nke Ya nēso uzọ-Ya ihe nile.


Mb͕e O chigharisiri n'ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, O we si n'iche, Ngọzi nādiri anya nāhu ihe unu nāhu:


Mb͕e O kwusiri okwu ndia, O we nāga n'iru, nārigoro Jerusalem.


O rue, mb͕e ubọchi nēzu okè mb͕e agānara Ya n'elu, na Ya onwe-ya che iru-Ya si-ike iga Jerusalem,


Ya mere Tomas, onye anākpọ Didimọs, siri ibe-ya ndi nēso Jisus, Ka ayi onwe-ayi je kwa, ka ayi we so Ya nwua.


Ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Rabai, ub͕u a ka ndi-Ju nāchọ uzọ itu Gi nkume; Ì nēje kwa ebe ahu ọzọ?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan