43 O we dọ ya aka na nti nke-uku, we chupu ya ngwa ngwa,
43 Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya,
Ewe saghe anya-ha. Jisus we dọ ha aka na nti nke-uku, si, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara ima ya.
Ngwa ngwa ekpenta ahu we rapu ya, eme kwa ka ọ di ọcha.
si ya, Lezi anya ka i ghara igwa onye ọ bula okwu ọ bula: ma laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha nke Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà.
Ọ nābasi-kwa-ra ha nba ike, ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè.
O we gwasie ha ike ka onye ọ bula ghara imara nka: O we si ka enye ya ihe-oriri.
O we gwasie ha ike ka ha ghara igwa onye ọ bula: ma ka ọ ra, bú otú Ya onwe-ya gwasiri ha ike, otú a ka ha nēkwusa kari ya nke-uku.
Ibobo we nwubiga ndi muru ya ókè n'aru: ma O nyere ha iwu ka ha ghara igwa onye ọ bula ihe emereri.