Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 1:13 - Bible Nso

13 O we nọ n'ọhia ọgu ubọchi abua, Setan nānwa Ya; Ya na anu ọhia nile nọ kwa; ndi-mọ-ozi nēje-kwa-ra Ya ozi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ọ nọkwara nʼime ọzara ahụ iri ụbọchị anọ, ebe ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa nọkwa. Ma ndị mmụọ ozi jeere ya ozi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 1:13
13 Iomraidhean Croise  

Moses we ba n'etiti igwe-oji ahu, rigorue ugwu ahu: Moses we nọ n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali.


Ọ we nọ n'ebe ahu, ya na Jehova, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri o riri, ọ dighi kwa miri ọ ṅuru. Ọ we de n'elu mbadamba nkume abua ahu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú okwu iri ahu.


Ma-ọbu i nēchè na apughm iriọ Nnam, Ọ gēzite-kwa-ram ọbuná ub͕u a kari legion iri na abua nime ndi-mọ-ozi?


Mb͕e ahu Mọ Nsọ duru Jisus rigo n'ọhia ka ekwensu we nwa Ya.


Ma ebe Jisus juputara na Mọ Nsọ, O si na Jọdan laghachi, Mọ ahu we duru Ya nāgaghari n'ọhia,


O rue, n'ọgwugwu ọgu ubọchi abua, ehihie na abali, na Jehova nyerem mbadamba nkume abua ahu, bú mbadamba nkume nke ọb͕ub͕a-ndu ahu.


M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova, dika na mbu, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru; n'ihi nmehie-unu nile nke unu mehiere, n'ime ihe ọjọ ahu n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe.


M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova ọgu ubọchi abua ahu, ehihie na abali, nke m'tururu onwem n'ala; n'ihi na Jehova siri na Ọ gēkpochapu unu.


Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.


N'ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n'adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n'ihe nile n'otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan