Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Mak 1:1 - Bible Nso

1 Nmalite ozi ọma jisus Kraist, Ọkpara Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mmalite oziọma maka Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Mak 1:1
23 Iomraidhean Croise  

M'gākọ akukọ bayere ukpuru: Jeohva sirim, Ọkparam ka gi onwe-gi bu; Mu onwem amuwo gi ta.


Ma ndi nọ n'ub͕ọ ahu kpọrọ isi ala nye Ya, si, I bu Ọkpara Chineke n'ezie.


Mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, le, igwe-oji nke nēnwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma; nurunu okwu-Ya.


ma le, olu sitere n'elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.


Onye-ọnwunwa we biakute Ya, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, kwue ka nkume ndia ghọ ob͕e achicha.


Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke.


Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.


Mu onwem ahuwo kwa, b͕a kwa àmà na Onye a bu Ọkpara Chineke.


Nataniel zara Ya, si, Rabai, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke; Gi onwe-gi bu Eze Israel.


ma edewo ihe ndia n'akwukwọ, ka unu we kwere na Jisus bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke; ka unu we nwe kwa ndu n'aha-Ya n'ihi na unu kwere.


N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.


Ọzọ, ayi onwe-ayi ekwerewo mara kwa na Gi onwe-gi bu Onye Nsọ ahu nke Chineke.


nāmalite na baptism nke Jọn, rue ubọchi anapuru Ya n'ebe ayi nọ rigo n'elu-igwe, otù onye nime ndia aghaghi iso ayi buru onye-àmà nke nbilite- n'ọnwu-Ya.


mb͕e Jọn buru uzọ kwusa baptism nke nechègari nye ndi Israel nile, mb͕e Ọ kābataghi.


N'ihi na ihe iwu ahu nāpughi ime, nke ọ nādighi ike nime ya site n'anu-aru, Chineke mere, n'ihi na Ọ mara nmehie ikpé n'anu-aru, mb͕e O zitere Ọkpara nke aka Ya n'oyiyi nke anu-aru nmehie na dika àjà achuru n'ihi nmehie:


Onye ahu Nke nāzọdoghi Ọkpara nke aka Ya, kama Ọ rara Ya nye n'ihi ayi nile, Ò gēsi aṅa ghara inye kwa ayi ihe nile n'amara ebe O weresiri Onye ahu nye ayi?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan