Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Luk 9:2 - Bible Nso

2 O we zipu ha ikwusa ala-eze Chineke, na ime ka aru di ndi-nriaria ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 O nyere ha ikike, zipụ ha ikwusa alaeze Chineke na ịgwọ ndị nrịa nrịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Luk 9:2
14 Iomraidhean Croise  

Ndikom iri na abua ahu ka Jisus zipuru, O we nye ha iwu, si, Unu ejela n'uzọ ndi mba ọzọ, unu abà-kwa-la n'obodo ndi Sameria:


Mb͕e onye ọ bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma ọ ghọtaghi ya, ajọ onye ahu abia, punara ihe aghaworo n'obi-ya. Onye a bu nke aghara n'akuku uzọ.


Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n'elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mb͕e ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa.


si, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.


O we si ha, Ganu n'uwa nile, kwusara ihe nile ekère èkè ozi ọma nkem.


Ha we pua, kwusa ka madu chègharia.


Ma mb͕e ihe ndia gasiri Onye-nwe-ayi guputara ọgu ndikom atọ na iri di iche, we zipu ha abua abua ka ha ga n'iru Ya ba n'obodo na ebe ọ bula, ebe Ya onwe-ya gaje ibia.


Ọbuná ájá si n'obodo-unu, nke rakuru n'ukwu-ayi, ka ayi nēhichapu imegide unu: otú ọ di, maranu nka, na ala-eze Chineke di nso.


mekwanu ndi aru-ha nādighi ike nọ n'ebe ahu ka aru-ha di ike, si-kwa-nu ha, Ala-eze Chineke di unu nso.


Iwu Chineke na ndi-amuma-Ya di rue oge Jọn: site n'oge ahu anēzisa ozi ọma ala-eze Chineke, madu nile n'otù n'otù were ihe-ike nābà nime ya.


Ma mb͕e ìgwè madu nile mara ya, ha soro Ya: O we nara ha nke-ọma, we gwa ha okwu bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi ọ di nkpà ka eme ka aru-ha di ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan