Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Luk 8:3 - Bible Nso

3 na Joana nwunye Kuza onye Herod tiyere ihe-ya n'aka, na Susana, na ọtutu ndi ọzọ, ndi nēweputa ihe ha nwere ime ezi ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 na Joana nwunye Chuza onye na-elekọta ụlọeze Herọd na akụ ya niile, na Suzana, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ji akụ ha na-enyere ha aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Luk 8:3
19 Iomraidhean Croise  

Ma ònye ka mu onwem bu, òle ndi ka ndim bu kwa, na ayi nwere ike iwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ayi otú a? n'ihi na n'ebe I nọ ka ihe nile si bia, ọ bu kwa ihe si n'aka-Gi bia ka ayi nyere Gi.


Urù-ahia-ya na onyinye-ikwa-iko-ya gāghọ kwa ihe nsọ Jehova nwere: agaghi-edebe ya n'ulo-àkù, agaghi-ebukọba kwa ya; n'ihi na ndi bi n'iru Jehova gēnwe urù-ahia-ya, iriju afọ, na inwe ákwà-nb͕okwasi nādigide adigide.


N'oge ahu Herod, bú tetrarch, nuru akukọ Jisus,


N'ihi na Herod jidereri Jọn, we ke ya ab͕u, tiye ya n'ulo-nkpọrọ n'ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya.


Ma mb͕e ncheta ọmumu Herod ruru, nwa-nwanyi Herodias tere egwú n'etiti, o we tọ Herod utọ.


Ha we ba nime ulo, hu Nwatakiri ahu, Ya na Meri nne-Ya; ha we da n'ala kpọ isi ala nye Ya; ha we kpughe ib͕e àkù ha, che onyinye n'iru Ya, ọla-edo na frankincense na myrrh.


Ma mb͕e o ruru anyasi, onye-nwe ubi-vine ahu si onye o tiyere ihe-ya n'aka, Kpọ ndi-ọlu ahu, kwua ha ugwọ-ọlu-ha, malite site na ndi-ikpe-azu rue ndi bu uzọ.


Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye.


N'ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n'etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.


Ọtutu ndinyom nọ kwa n'ebe ahu ndi nọ n'ebe di anya nēkiri, ndi si na Galili soro Jisus, nējere Ya ozi:


Ma ha bu Meri Magdalini, na Joana, na Meri nne Jemes: ndinyom fọduru ndi soro ha we gwa ndi-ozi-Ya ihe ndia.


Ma nka ka o kwuru, ọ bughi n'ihi na ọ kpọrọ ndi-ob͕eye ihe; kama n'ihi na ọ bu onye-ori, na ebe o ji àkpà-ego, ọ nēwepu ihe anētiye nime ya.


Ma ndi-amuma na ndi-ozizí di n'Antiọk, nime nzukọ Kraist di n'ebe ahu, bú Banabas, na Simeon onye anākpọ Naiga, na Lusiọs onye Sairini, na Manaen onye azùkọrọ ya na Herod, bú tetrarch, na Sọl.


N'ihi na unu mara amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na, ọ bu ezie na Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ob͕eye n'ihi unu, ka unu onwe-unu we were ob͕eye-Ya ghọ ndi-ọgaranya.


Ndi nsọ nile nēkele unu, ma ndi nke èzí-na-ulo Sisa kachasi n'ikele unu.


onye anāb͕ara ya ezi àmà n'ọlu ọma; ọ buru na ọ zùputawo umu, ọ buru na o lewo ndi-ọbìa anya nke-ọma, ọ buru na ọ sawo ukwu ndi nsọ, ọ buru na o b͕owo nkpà ndi anākpab͕u, ọ buru na o sosiwo ezi ọlu nile ọ bula ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan