Hairam, bú eze Taia, we zìe ndi-orù-ya jekuru Solomon: n'ihi na ọ nuru na ya ka ha tere manu ibu eze n'ọnọdu nna-ya: n'ihi na onye nāhu Devid n'anya ubọchi nile ka Hairam bu.
Jisus we so ha ga. Ma mb͕e Ọ nādighi n'ebe di anya n'ulo-ya ub͕u a, ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise we zigara Ya ufọdu ndi-enyì-ya, si Ya, Onye-nwe-ayi, esob͕ula Onwe-gi: n'ihi na erughm ka I ba n'okpuru ulom:
N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.