Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Luk 5:8 - Bible Nso

8 Ma mb͕e Saimon Pita huru ya, o we da n'ala n'ikperè Jisus, si, Si n'ebe m'nọ pua; n'ihi na abum onye-nmehie, Onye-nwe-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, ọ dara nʼukwu Jisọs sị, “Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Luk 5:8
19 Iomraidhean Croise  

M'we si, Ahuhu nādirim, n'ihi na alawom n'iyì; n'ihi na onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ruru árú ka m'bu, ọ bu kwa n'etiti ndi eb͕ub͕ere-ọnu-ha ruru árú ka m'nēbi: n'ihi na ọ bu Eze-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ka anyam abua huworo.


Mb͕e m'huru Ya, m'we da n'ala n'ukwu-Ya dika onye nwuru anwu. O we bikwasim aka-nri-Ya, si, Atula egwu; Mu onwem bu onye mbu na onye ikpe-azu,


Manoa we si nwunye-ya, Ayi aghaghi inwu, n'ihi na ọ bu Chineke ka ayi huworo.


Ha si Moses, Gi onwe-gi kpayere ayi uka, ayi gānu kwa: ma Chineke akpayerela ayi uka, ka ayi we ghara inwu.


Le, abum onye elelìworo; gini ka m'gāzaghachi Gi? Atukwasiwom, akam, n'ọnum.


Ndikom Bet-shemesh we si, Ònye puru iguzo n'iru Jehova, bú Chineke nsọ a? Ọ̀ bu kwa onye ka O gēsi n'ebe ayi nọ rigokuru?


Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ha we da kpuchie iru-ha n'ala, tu kwa egwu ri nne.


Ya mere Meri, mb͕e ọ biara n'ebe Jisus nọ, mb͕e ọ huru Ya, ọ da n'ala n'ukwu-Ya, nāsi Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nọri n'ebe a, nwa-nnem nwoke agaghi-anwuwori.


Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise zara, si, Onye-nwe-ayi, erughm ka I ba n'okpuru ulom: kama were nání okwu-ọnu kwue, agēme kwa ka aru onye nējerem ozi di ike.


Ha we ba nime ulo, hu Nwatakiri ahu, Ya na Meri nne-Ya; ha we da n'ala kpọ isi ala nye Ya; ha we kpughe ib͕e àkù ha, che onyinye n'iru Ya, ọla-edo na frankincense na myrrh.


Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua?


Devid we tua egwu Jehova n'ubọchi ahu; ọ si, Ìb͕e Jehova gēsi aṅa biakutem?


N'ihi na ub͕u a ayi ji enyo hu ihe, nime ilu; ma mb͕e ahu ayi gāhu iru na iru: ub͕u a m'mara na nkpirikpi; ma mb͕e ahu m'gāmazu dika amazu-kwa-ram.


ha we fere ndi-nketa-ibe-ha aka, bú ndi nọ n'ub͕ọ-ha ọzọ, ka ha bia nyere ha aka. Ha we bia, b͕ujue ub͕ọ̀ abua ahu, ya mere ha malitere imìkpu.


N'ihi na ibobo ob͕ub͕u azù ha b͕uru nwuru ya na ndi nile ya na ha nọ n'aru;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan