Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Luk 4:2 - Bible Nso

2 ekwensu nānwà kwa Ya ọgu ubọchi abua. O righi kwa ihe ọ bula n'ubọchi ahu: mb͕e ubọchi ahu zuru, agu we gua Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ebe ahụ ka ekwensu nwara ya ọnwụnwa iri ụbọchị anọ. Nʼụbọchị ndị ahụ niile o righị nri ọbụla. Nʼikpeazụ agụụ gụrụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Luk 4:2
16 Iomraidhean Croise  

iro ka M'gētiye kwa n'etiti gi na nwayi ahu, na n'etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi n'isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n'ikiri-ukwu.


O we bilie, rie ihe, ṅu kwa miri, je n'ike ihe-oriri ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali rue ugwu Chineke, bú Horeb.


Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n'uzọ di otú a ka m'gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n'iyì, alawom n'iyì.


Moses we ba n'etiti igwe-oji ahu, rigorue ugwu ahu: Moses we nọ n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali.


Ọ we nọ n'ebe ahu, ya na Jehova, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri o riri, ọ dighi kwa miri ọ ṅuru. Ọ we de n'elu mbadamba nkume abua ahu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú okwu iri ahu.


O we tie nkpu, kwusa nime Nineve site n'iwu eze na ndi uku ya, si, Ka madu na anumanu, ma ìgwè ehi ma ìgwè ewu na aturu, ghara idetu ihe ọ bula n'ọnu: ka ha ghara izù onwe-ha, ghara kwa iṅu miri:


Ma n'ututu mb͕e Ọ nālaghachi n'obodo ahu, agu guru Ya.


Mb͕e O busiri ọnu ọgu ubọchi abua ehihie na abali, emesia agu guru Ya.


Ekwensu we si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọ ob͕e achicha.


ma isi-iyi Jekob di n'ebe ahu. Ya mere Jisus, ebe ike gwuru Ya n'ije-Ya, Ọ nọduru ala otú a n'usọ isi-iyi ahu. Ọ ra ka oge hour nke-isi.


M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova, dika na mbu, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru; n'ihi nmehie-unu nile nke unu mehiere, n'ime ihe ọjọ ahu n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe.


M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova ọgu ubọchi abua ahu, ehihie na abali, nke m'tururu onwem n'ala; n'ihi na Jehova siri na Ọ gēkpochapu unu.


Mb͕e m'rigoro n'ugwu inara mbadamba nkume abua ahu, bú mbadamba nkume nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Jehova b͕ara nye unu, m'we nọdu n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru.


N'ihi na ebe Ya onwe-ya huworo ahuhu site n'ọnwunwa anwara Ya, Ọ puru iyere ndi anānwa aka.


N'ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n'adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n'ihe nile n'otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi.


Onye Filistia ahu nābiaru kwa nso n'isi-ututu na n'anyasi, we guzo onwe-ya ọgu abali abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan