Oziọma Luk 3:9 - Bible Nso9 Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi kwa anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile; ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a9 Ọ bụladị ugbu a, atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi, osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu tụba ya nʼime ọkụ.” Faic an caibideil |
Ma ebe eze huru otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, ka o nēsi n'elu-igwe ridata, si, B͕utuenu osisi ahu, mebie ya; ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n'ala, ọbuná n'ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n'ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n'etiti anu ọhia, rue mb͕e oge asa gāgabiga n'isi ya;