Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Luk 2:9 - Bible Nso

9 Mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we guzo ha nso, ebube nke Onye-nwe-ayi muba-kwa-ra ha gburugburu: ha we tua egwu nke-uku.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Luk 2:9
27 Iomraidhean Croise  

ndi-nchu-àjà we ghara inwe ike iguzo ije ozi n'ihi igwe-oji ahu: n'ihi na ebube Jehova juputara ulo Jehova.


O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n'igwe-oji ahu.


n'ututu ka unu gāhu kwa ebube nke Jehova; ebe Ọ nānu ntamu nile unu nātamu megide Jehova: ma àyi onwe-ayi bu gini, na unu nātamu ntamu megide ayi?


Ọ gāb͕awa nke-uku, teghari kwa egwú ọṅù, e, n'iteghari-egwú-ọṅù na n'iti-nkpu-ọṅù; nsọpuru Lebanon ka agēnye ya, e, ima-nma nke Kamel na Sheron: ndia gāhu ebube Jehova, bú ima-nma nke Chineke-ayi.


agēkpughe kwa ebube Jehova, anu-aru nile, bú madu, gāhukọ kwa ya n'otù: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.


Bilie, nwue; n'ihi na ìhè-gi abiawo, ebube Jehova awawo kwa n'aru gi dika anyanwu.


M'we bilie, pua, jerue ndagwurugwu ahu: ma, le, n'ebe ahu ka ebube Jehova nēguzo, dika ebube nke m'huru n'akuku osimiri Keba: m'we da kpue irum n'ala.


Ma mb͕e ihe ndia di ya n'obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n'ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n'aka Mọ Nsọ.


O we bata n'ebe ọ nọ, si, Ekele, gi onye Chineke meworo ka i nara amara, Onye-nwe-ayi nọyere gi.


Ndi-ọzùzù-aturu di n'otù ala ahu nānọ n'ọhia, nēche kwa ìgwè aturu-ha n'abali.


O we rue, mb͕e ha nọ n'obi abua n'ihi nka, le, ndikom abua guzoro ha nso n'uwe nēb͕u àmùmà:


Ihe ndia ka Aisaia kwuru, n'ihi na ọ huru ebube-Ya; o kwu-kwa-ra okwu bayere Ya.


Ma le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi guzoro ya nso, ìhè nwu-kwa-ra n'ime-ulo nke ulo-nkpọrọ: o we tie Pita aka n'akuku, kpote ya, si, Bilie ọsọsọ. Nkpọrọ-ya abua we dapu n'aka-ya abua.


N'ihi na mọ-ozi nke Chineke ahu Onye nwem, Onye m'nēkpe-kwa-ra guzorom nso n'abali a,


Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi meghere ọnu-uzọ nile nke ulo-nkpọrọ ahu n'abali, we duputa ha, si,


Ma ayi onwe-ayi nile ebe ayi were iru nke ekpupuworo ihe-nkpudo nēgosi ebube nke Onye-nwe-ayi dika enyo, anēnwogha ayi rue n'otù onyinyo ahu site n'ebube rue ebube, ọbuná dika anēnye ya site n'Onye-nwe-ayi, bú Mọ Nsọ.


N'ihi na ọ bu Chineke, Onye siri, Ìhè gēsi nime ọchichiri nwuputa, bu Onye nwubàra nime obi-ayi, iweta inye-ìhè nke ọmuma nke ebube nke Chineke n'iru nke Jisus Kraist.


Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.


ka ihe ahu anēkiri si di kwa egwu nke-uku, Moses siri, Anamatu oké egwu, aru ma-kwa-ram jijiji:


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi nelu-igwe ridata, nēnwe ike uku; ewe site n'ebube-ya nye uwa ìhè.


M'we hu oké oche-eze di ọcha, na Onye nānọkwasi ya, Onye uwa na elu-igwe b͕apuru n'iru Ya; ahughi kwa ebe ọ bula nye ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan